Pular para o conteúdo
Publicidade

2 Ihe E Mere 12

Shishak ebusoo Jerusalem agha

1 Ma mgbe e mere ka alaeze Rehoboam guzosie ike, mgbe dịkwa ike, hapụrụ iwu Onyenwe anyị ya na ndị Izrel12:1 Izrel nʼebe a na-ekwu maka ndị Juda, otu a ka ọ dịkwa nʼakwụkwọ 2Ih. niile. 2 Nʼihi na ha ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, Shishak eze Ijipt busoro Jerusalem agha nʼafọ nke ise nke ọchịchị eze Rehoboam. 3 O ji otu puku ụgbọ agha na narị abụọ, na ndị agha na-agba ịnyịnya dị puku iri isii, na ndị agha ụkwụ ala, ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị agha si Libịa, Sukim na Kush, ndị sooro ya site nʼala Ijipt. 4 O merikwara obodo niile e wusiri ike nke Juda ma bịarukwaa Jerusalem.

5 Mgbe ahụ, Shemaya onye amụma bịakwutere Rehoboam na ndịisi Juda niile, ndị zukọtara na Jerusalem nʼihi egwu Shishak, sị ha, "Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, Unu ahapụla m, nʼihi ya, ahapụkwala m unu, nyefee unu nʼaka Shishak.’ "

6 Ndị ndu Izrel na eze wedara onwe ha nʼala sị, "Onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ."

7 Mgbe Onyenwe anyị hụrụ otu ha si weda onwe ha nʼala, okwu Onyenwe anyị bịakwutere Shemaya, sị, "Ebe bụ na ha ewedala onwe ha nʼala, agakwaghị m ebibi ha kama aga m eme ka ha nwe nzọpụta ngwangwa. Agakwaghị m eji Shishak gosi Jerusalem oke iwe m. 8 Ma otu dị, ha ga-abụrụ ya ohu, ka ha nwe ike mata dị iche dị nʼetiti ijere m ozi na ijere ndị eze ala ọzọ dị iche iche ozi."

9 Mgbe Shishak eze Ijipt busoro Jerusalem nʼagha; o bukọrọ akụ niile dị nʼime ụlọ Onyenwe anyị, na akụ niile dịkwa nʼụlọeze. kwakọọrọ ihe niile, werekwa ọta ọlaedo ndị ahụ Solomọn kpụrụ. 10 Ma eze Rehoboam kpụrụ ọta bronz i ji dochie ndị ahụ, nyefee ha nʼaka ndịisi ndị nche, bụ ndị na-eche nʼọnụ ụzọ ụlọeze nche ka a lekọta ha anya. 11 Mgbe ọbụla eze na-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ndị nche na-eso ya buru ọta ndị ahụ, emesịa, ha na-ebughachikwa ha nʼime ụlọ ndị nche.

12 Mgbe eze wedara onwe ya nʼala, iwe Onyenwe anyị na-eweso ya dajụrụ, laghịkwa ya nʼiyi kpamkpam. Nʼezie, ezi ihe fọdụkwara na Juda.

13 Eze Rehoboam mere onwe ya ka dị ike na Jerusalem na-achịkwa ka eze. gbara iri afọ anọ na otu mgbe malitere ịbụ eze, chịrị afọ iri na asaa na Jerusalem, bụ obodo ahụ Onyenwe anyị họọrọ site nʼetiti ebo niile nke Izrel, bụ ebe ga-akpọkwasị Aha ya. Aha nne ya bụ Naama, onye Amọn. 14 O mere ihe ọjọọ, nʼihi na dịghị mgbe ọbụla o kpebiri nʼobi ya ịchọ Onyenwe anyị.

15 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Rehoboam, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ nke Shemaya onye amụma na nke Ido onye ọhụ ụzọ, nke na-ahụ maka ihe banyere usoro ọmụmụ niile? Agha dịgidere nʼetiti Rehoboam na Jeroboam ụbọchị niile nke ndụ ha. 16 Rehoboam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid. Abija nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também