Isi anyụike esee nʼelu mmiri
1 Ụmụ ndị amụma gwara Ịlaisha okwu sị, "Lee, ebe a anyị bi nʼihu gị dị oke nta karịa. 2 Ya mere, ka anyị gaa nʼakụkụ Jọdan gbute osisi anyị ga-eji wuo ụlọ ebe anyị ga-ebi."
Ọ sịrị ha, "Meenụ ka unu kwuru."
3 Ma otu onye nʼime ha rịọrọ ya sị, "Biko, nna anyị ukwu, soronụ anyị."
O kwenyere na ọ ga-eso ha. 4 O sonyekwara ha.
Mgbe ha bịaruru nʼakụkụ Jọdan, ha malitere igbutu osisi. 5 Ma mgbe otu nʼime ha nọ na-egbutu otu osisi, anyụike ya dabara nʼime mmiri. O tiri mkpu sị, "Ewoo, onyenwe m. Ọ bụkwanụ ihe a rịọtara arịọta."
6 Mgbe ahụ, onye nke Chineke jụrụ ya sị, "Ebee ka ọ dabara?" Mgbe o ziri ya ebe ọ dabara, Ịlaisha gbutere osisi tụba ya nʼebe ahụ, mee ka anyụike ahụ segolite na-erugharị nʼelu mmiri. 7 Ọ sịrị, "Tụtụlite ya." O setịrị aka ya wepụta ya.