10 Ma Rizpa, nwa nwanyị Aịa were akwa mkpe gbasara onwe ya nʼelu nkume. O kweghịkwa ka anụ ufe bekwasị ha nʼehihie, maọbụ anụ ọhịa nʼabalị. Ọ nọgidere nʼebe ahụ site nʼoge mmalite owuwe ihe ubi tutu ruo mgbe mmiri bidoro izokwasị anụ ahụ ha. 11 Mgbe a gwara Devid ihe Rizpa, nwa nwanyị Aịa, iko nwanyị Sọl mere,