Pular para o conteúdo
Publicidade

2 Samuel 5

Devid abụrụ eze ndị Izrel niile

1 Mgbe ahụ, ndị ebo Izrel niile bịakwutere Devid na Hebrọn, sị ya, "Lee, ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị ka anyị bụ. 2 Nʼoge gara aga, mgbe Sọl bụ eze na-achị anyị, bụ gị duuru ndị agha Izrel nʼọgụ niile, ma ọpụpụ ma mbata. Onyenwe anyị sịrị gị, ga-azụ ndị m, bụ Izrel, ga-abụkwa onye ga-achị ha.’ "

3 Mgbe ndị okenye Izrel niile bịakwutere Devid na Hebrọn, ha na eze Devid gbara ndụ nʼihu Onyenwe anyị na Hebrọn. Ha tere Devid mmanụ5:3 Otite mmanụ a, bụ nke ugboro atọ a na-ete Devid ịbụ eze ndị Izrel. 1Sa 16:13; 2Sa 2:4 ịbụ eze Izrel.

Veja também