Publicidade

2 Samuel 6

12 Mgbe a gwara eze bụ Devid si, "Onyenwe anyị agọziela ezinaụlọ Obed-Edọm na ihe niile o nwere, nʼihi igbe ọgbụgba ndụ Chineke." Nʼihi nke a, Devid ji oke ọṅụ gaa nʼụlọ Obed-Edọm, nʼihi ibugote igbe ọgbụgba ndụ Chineke, buga nʼobodo Devid. 13 Mgbe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ zọrọ nzọ ụkwụ isii; na-eji oke ehi na nwa ehi gbara abụba chụọ aja. 14 Devid ji ike ya niile na-ete egwu nʼihu Onyenwe anyị. yi uwe efọọd e ji akwa ọcha dụọ nʼụbọchị ahụ, 15 mgbe ya na ndị Izrel niile ji iti mkpu na ụda ịfụ opi ike na-ebubata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-