9 Dragọn ukwu ahụ, bụ agwọ ochie ahụ a na-akpọ ekwensu maọbụ Setan, nke na-eduhie ndị niile bi nʼụwa. A tụdara ya nʼụwa, ya na ndị mmụọ ozi ya niile.
10 Mgbe ahụ, anụrụ m oke olu si nʼeluigwe na-ada sị,
"O mezuola nʼikpeazụ, bụ nzọpụta Chineke na ike
na alaeze Chineke anyị, na ikike ịchị isi Kraịst ya,
ha abụrụla ihe dị ire.
Nʼihi na e sitela nʼeluigwe chụtuo
onye ahụ na-ebo ụmụnna anyị ebubo.
Ọ na-ebo ha ebubo ehihie na abalị nʼihu Chineke.