Otuto dịrị Onyenwe anyị
1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, anụrụ m ụzụ nke ọtụtụ igwe mmadụ nʼeluigwe. Ha niile na-eti mkpu na-asị,
"Haleluya!
Nzọpụta, na ebube na ike niile dịrị Chineke anyị.
2 Nʼihi na ikpe ikpe ya niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu.
Ọ kpeela nwanyị ahụ na-akwa iko ikpe,
onye ji ịkwa iko ya merụọ ụwa.
Ọ bọọlara ọbọ ọbara ndị ohu ya nʼisi ya."
3 Ọzọkwa, ha tiri mkpu,
"Haleluya!
Anwụrụ ọkụ si nʼime ya na-arịgo elu ruo mgbe ebighị ebi."