11 Mgbe ahụ kwa, elere m anya hụ ka eluigwe meghere. Ahụkwara m otu ịnyịnya dị ọcha. Onye nọkwasịrị nʼelu ya bụ onye a na-akpọ Onye kwesiri ntụkwasị obi na Onye eziokwu. Ọ bụ onye na-ekpe ikpe nʼụzọ ziri ezi na-ebukwa agha. 12 Anya ya na-acha dịka ire ọkụ. Ọtụtụ okpueze dịkwa ya nʼisi. Otu aha nke naanị ya maara omimi ya ka e dekwasịrị ya nʼegedege ihu. 13 E gbokwasịrị ya uwe mwụda e denyere nʼọbara. Aha a na-akpọ ya bụ Okwu Chineke. 14 Usuu ndị agha nke eluigwe, ndị yi uwe ezi akwa ọcha, na-enweghị ntụpọ, nọ nʼelu ịnyịnya ọcha na-eso ya. 15 Ọ kpụ mma agha dị nkọ nʼọnụ ya, nke o ji egbutu mba niile. "Ọ ga-eji mkpara igwe achị ha."19:15 Abụ 2:9 Ọ na-azọchakwa mkpụrụ vaịnị nʼebe ịnara mmanya nke iwe ọkụ nke Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. 16 Otu aha ka e dere nʼelu uwe ya na nʼelu apata ya:
Eze kachasị ndị eze niile, na Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile.