14 Ma enwere m ihe ole ma ole megide gị. I nwere ụfọdụ mmadụ ebe ahụ, ndị jidesiri nkuzi Belam ike, bụ onye kuziiri Balak ka o raa ụmụ Izrel ụra nke mere ka ha mehie, rie ihe a chụrụ nʼaja nye arụsị, kwaakwa iko. 2:14 Ọ bụ Belam kuziri Balak ụzọ ọ ga-esi rara ndị Izrel nye na nnupu isi megide iwu Chineke nyere ha banyere ife arụsị, nʼakwụkwọ Ọnụ 31:15-16, ịkwa iko na ịlụ di maọbụ nwunye site na mba ọzọ. Iwu ndị a dị nʼakwụkwọ Dit 7:3-11. 15 Nʼotu aka ahụ, i nwekwara ụfọdụ mmadụ ndị jidesiri nkuzi Nikolaitan ike. 16 Ya mere, chegharịa! Ma ọ bụghị otu a, aga m abịakwute gị ọsịịsọ jiri mma agha dị m nʼọnụ buso ha agha.
Publicidade