Publicidade

Apocalipse 3

Nzukọ dị nʼobodo Sardis

1 "Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Sardis, sị ya:

Ndị a bụ okwu onye ahụ nwere mmụọ asaa nke Chineke na kpakpando asaa.

Amaara m ọrụ gị niile, nwere aha dịka onye dị ndụ ma bụ onye nwụrụ anwụ. 2 Ugbu a, sị nʼụra bilite. Mee ka ihe ntakịrị ahụ fọdụrụ na-achọ ịnwụ anwụ dịrị ike. Nʼihi na dịghị ọrụ gị m hụrụ dị ka ihe zuruoke nʼanya Chineke m. 3 Ya mere, cheta ihe ndị ahụ natara na nke nụrụ; rube isi nye ya, chegharịakwa. Ma bụrụ na i tetaghị, aga m abịakwute gị dị ka onye ohi, gaghị amatakwa oge m ji bịakwute gị.

4 Otu dị, i nwere ụfọdụ mmadụ na Sardis ndị na-emerụbeghị uwe ha. Ha ga-eyiri uwe ọcha ma soro m jee ije nʼihi na ha bụ ndị kwesiri ekwesi. 5 Onye ọbụla na-emeri emeri, ka a ga-eyikwasị uwe mwụda ọcha dịka ha. Agaghị m ehichapụ aha ya site nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ, kama aga m ekwupụtakwa aha ahụ nʼihu Nna m na nʼihu ndị mmụọ ozi niile. 6 Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ nsọ na-agwa nzukọ niile.

Nzukọ dị nʼobodo Filadelfia

7 "Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Filadelfia, sị ya:

Ndị a bụ okwu onye dị nsọ na onye eziokwu, onye ahụ ji ọtụghe igodo Devid, nke o ji emeghepụ ihe onye ọbụla na-apụghị imechi, na nke o ji emechi ihe onye ọbụla na-apụghị imeghe.

8 Amaara m ọrụ gị niile. Lee, edebela m nʼihu gị ọnụ ụzọ nke e meghere emeghe, nke onye ọbụla na-apụghị imechi. Amaara m na i nwere ike dị ntakịrị, ma i debere okwu m, gọnarịkwaghị aha m. 9 Aga m eme ka ndị ahụ so na nzukọ ekwensu, bụ ndị na-asị na ha bụ ndị Juu ma ha abụghị, kama ha bụ ndị ụgha, aga m eme ka ha bịa kpọọ isiala nye gị, si otu a ghọta na ahụrụ m gị nʼanya. 10 Ebe i sitere na ntachiobi sọpụrụ okwu m niile, aga m ekpuchi gị site nʼoke mkpagbu ahụ, nke ga-abịakwasị ụwa mgbe a ga-anwale ndị niile bi nʼime ya.

11 Ana m abịa ọsịịsọ. Jidesienụ ihe unu nwere aka ike, ka onye ọbụla ghara ịnapụ gị okpueze gị. 12 Ma onye ọbụla na-emeri emeri, ka m ga-eme ka bụrụ ogidi nʼime ụlọnsọ Chineke m. gaghị esikwa nʼebe ahụ pụọ apụọ. Aga m edekwasịkwa aha Chineke m nʼahụ, na aha obodo nsọ Chineke, nke bụ Jerusalem ọhụrụ ahụ si nʼeluigwe, ebe Chineke nọ na-arịdata. Aha ọhụrụ m ka a ga-edekwasịkwa nʼihu ya. 13 Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile.

Nzukọ dị nʼobodo Laodisia

14 "Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Laodisia, sị ya:

Ndị a bụ okwu Amen, onye kwesiri ntụkwasị obi, na onye bụ ezi onyeama, bụrụkwa isi mmalite ihe niile Chineke kere.

15 Amaara m ọrụ gị niile, na jụghị oyi, i kpoghịkwa ọkụ. gaara adị nnọọ mma ma asị na na-ajụ oyi ma bụkwanụ na-ekpo ọkụ. 16 Nʼihi nke a, ebe na-ajụghị oyi, i kpoghịkwa ọkụ, ihe dị bụ ṅaraṅara. Nʼihi ya, aga m esi nʼọnụ m gbụpụ gị. 17 Nʼihi na na-asị, abụ m ọgaranya, nwezuo ihe niile. Mkpa ihe ọbụla akpakwaghị m.Ma ghọtaghị na onye gba aka ka bụ. bụ onye e kwesiri imere ebere. bụkwa ogbenye na onye kpuru ìsì na onye gba ọtọ. 18 Ana m adụ gị ọdụ ka ịzụta ezigbo ọlaedo nʼaka m, bụ ọlaedo a nụchara anụcha nʼime ọkụ. Mgbe ahụ, ga-abụkwa ọgaranya nʼezie. gaara esitekwa nʼaka m zụta akwa ọcha na-enweghị ntụpọ ka ghara ịgba ọtọ, ka ihere gharakwa ime gị. Ka zụrụkwa ezigbo ọgwụ ọrịa anya tee, ka ibido ịhụ ụzọ nke ọma.

19 Ndị m hụrụ nʼanya ka m na-abara mba na-enyekwa ha ahụhụ. Ya mere, nwee ịnụ ọkụ nʼobi, chegharịakwa. 20 Lee, ana m eguzo nʼọnụ ụzọ na-akụ aka. bụrụ na onye ọbụla anụ olu m ma meghee ụzọ, aga m abata soro ya rikọọ ihe, ya onwe ya ga-esokwa m rie ihe.

21 Onye ọbụla na-emeri emeri, ka mụ ga-enye ikike ka o soro m nọdụ nʼocheeze m. bụladị dịka m meriri sorokwa Nna m nọdụ nʼocheeze ya. 22 Onye nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-29_22-07-56-