5 Ma mgbe o meghere akara nke atọ, anụrụ m ka anụ nke atọ ahụ dị ndụ kwuru, "Bịa!" Ahụrụ m ịnyịnya dị ojii. Onye na-anọkwasị nʼelu ya ji ihe ọtụtụ abụọ nʼaka ya. 6 Anụkwara m ihe dị ka olu nke sitere nʼetiti anụ anọ ahụ dị ndụ na-adapụta sị, "Otu ihe ọtụtụ kilo6:6 Ihe ọtụtụ nta dị otu kilo nke ọka wiiti bụ ụgwọ ọrụ otu ụbọchị,6:6 Ya bụ, otu denarị ihe ọtụtụ kilo atọ6:6 Ihe ọtụtụ dị kilo atọ nke ọka balị bụkwa ụgwọ ọrụ otu ụbọchị. Ya mere, unu emebikwala mmanụ oliv na mmanya."
Publicidade