Pular para o conteúdo
Publicidade

Mkpughe 7

Ndị ozi Chineke a kara akara

1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m ndị mmụọ ozi anọ ka ha guzo nʼakụkụ anọ nke ụwa. Ha na-egbochikwa ka ifufe ọbụla ghara ife nʼelu ala, na nʼelu osimiri, na nʼelu osisi. 2 Mgbe ahụ, ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼọwụwa anyanwụ na-apụta, akara Chineke dị ndụ dịkwa nʼaka ya. O tikuru ndị mmụọ ozi anọ ahụ mkpu, bụ ndị ahụ e nyere ike imekpa ụwa ahụ, ya na oke osimiri, 3 na-asị, "Unu emebila ụwa maọbụ oke osimiri maọbụ osisi ọbụla tutu ruo mgbe anyị kachara ndị ohu niile nke Chineke anyị akara nʼegedege ihu ha." 4 Mgbe ahụ anụrụ m ọnụọgụgụ ndị a kara akara ahụ, ha dị narị puku mmadụ, na iri puku mmadụ anọ na anọ, bụ ndị sitere nʼebo niile nke Izrel.

5 Ndị a kara akara site nʼebo Juda dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).

Ndị si nʼebo Ruben dịkwa puku mmadụ iri na abụọ (12,000).

Ndị si nʼebo Gad dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).

6 E sitere nʼebo Asha họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000).

Ndị sitekwara nʼebo Naftalị dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).

E sitere nʼebo Manase7:6 Nʼebe a Manase nwa Josef, weere ọnọdụ Dan. họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000).

7 Ndị si nʼebo Simiọn dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).

Ndị sitere nʼebo Livayị dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).

Ndị si nʼebo Isaka dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).

8 E sitere nʼebo Zebụlọn họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000).

Ndị si nʼebo Josef dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).

Ndị sikwa nʼebo Benjamin dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também