Publicidade

Atos 2

Okwu Pita banyere Kraịst

14 Pita guzoro, ya na ndị ozi iri na otu ahụ welie olu gwa ọgbakọ ahụ okwu, "Ndị Juu na unu ndị bi na Jerusalem, matanụ nke a, geekwanụ ntị na ihe m na-ekwu. 15 bụghị mmanya na-egbu ndị a dị ka unu chere. Lee, bụ naanị elekere itoolu nke ụtụtụ na-akụ. 16 Mba, nke a bụ mmezu ihe Juel onye amụma kwuru,

17 " Chineke sịrị, nʼoge ikpeazụ,

aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m.

Ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma,

ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ,

ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ.

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-04_23-13-58-