Publicidade

Habacuque 1

1 Nke a bụ ozi Habakuk onye amụma natara.

Mkpesa Habakuk

2 Onyenwe anyị, ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-eti mkpu

ma ị dịghị ege ntị?

Ruo ole mgbe ka m ga na-etiku gị na-asị, "Ihe ike, ihe ike!"

ma ị dịghị azọpụta?

3 Nʼihi gịnị ka i ji eme m ka m na-ahụ ihe ọjọọ?

Gịnị mere i ji anagide mmegbu?

Mbibi na ihe ike dị nʼihu m,

na ịlụ ọgụ, na esemokwu jupụtakwara ebe niile.

4 Nʼihi ya, iwu na-ada mba,

ikpe ziri ezi adịghị agakwa nʼihu.

Ndị ajọ mmadụ na-agba ndị ezi omume gburugburu,

nke mere ka ikpe ziri ezi ghọọ ihe gbagọrọ agbagọ.

Ọsịsa Onyenwe anyị

5 "Legide mba niile anya, ka i hụ.

Lee, ka o ju gị anya nke ukwuu.

Nʼihi na agaje m ime ihe nʼụbọchị ndụ unu,

nke unu na-agaghị ekwenye,

ọ bụladị ma akọọrọ unu ya.

6 Nʼihi na lee, agaje m ime ka ndị Kaldịa bilie,

bụ mba ahụ na-adịghị eme ebere, na ndị na-eme ngwangwa.

Ha bụ ndị na-ebu agha na-ejegharị na mba niile,

ndị na-esite nʼaka ike na-enweta ebe obibi nke na-abụghị nke ha.

7 Ha bụ mba a na-atụ ụjọ, na ndị dịkwa egwu.

Ha bụ iwu nye onwe ha, ihe ha tụpụtara ka ha na-eme.

Ọ bụ onwe ha ka ha na-ebuli elu.

8 Ịnyịnya ha nwere ụkwụ nkọ karịa agụ.

Ha na-akpa ike karịa nkịta ọhịa nke na-ejegharị nʼanyasị.

Ndị ịnyịnya agha ha na-awụ ọsọ,

ndị ha na-agba ịnyịnya na-esitekwa ebe dị anya na-abịa.

Dịka ugo nke na-efedata i buru nri ọ ga-eri.

9 Ha niile na-abịa ime ihe ike.

Ha ji ọsọ na-abịa dịka oke ifufe nke ọzara.

Ha na-abịa ịchịkọta ndị a dọtara nʼagha dịka ha bụ uzuzu.

10 Ha na-akwa ndị eze emo,

jirikwa ndịisi ọchịchị na-eme ihe ọchị.

Ha na-achị ebe niile e wusiri ike ọchị,

na-ekpokọtakwa aja nʼazụ mgbidi niile ịlụta ha nʼagha.

11 Mgbe ahụ, ha na-esi nʼebe ahụ gabiga dịka ifufe, na-agabigakwa

ndị mehierenụ, bụrụkwa ndị ikpe mara, ndị ike ha bụ chi ha."

Mkpesa Habakuk nke ugboro abụọ

12 Onyenwe anyị, Ọ bụ na ị dịghị site mgbe niile ebighị ebi?

Chineke m, na Onye Nsọ m, Ị gaghị anwụ.

Gị, Onyenwe anyị, họpụtara ha maka ikpe ikpe.

Gị, oke nkume m, emeela ka ha bụrụ ndị ga-enweta ahụhụ.

13 Ma anya gị dị ọcha nke ukwuu, na ọ dịghị elekwasị ajọ ihe anya;

ị naghị anabatakwa mmegbu.

Ma gịnị mere i ji gba ndị aghụghọ nkịtị?

Gịnị mere i ji gba nkịtị mgbe ndị ajọ omume na-eloda

ndị bụ ndị ezi omume karịa ha?

14 I meela ndị mmadụ ka ha dịrị ka azụ nke osimiri,

e, dịka anụ na-akpụ akpụ nke oke osimiri, nke na-enweghị onye na-achị ha.

15 Onye iro nke ajọ omume juru obi, na-eji nko ya na-egbu ha.

Ọ na-ejikwa nko ụgbụ ya na-ejide ha.

Ọ na-achịkọta ha nʼụgbụ ya,

si otu a na-aṅụrị ọṅụ, ma na-etegharịkwa egwu ọṅụ.

16 Nʼihi nke a, ọ na-achụ aja

na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ụgbụ ya,

nʼihi na ọ bụ ụgbụ ya na-eme ka ọ na-ebi ezi ndụ,

na-erikwa nri kachasị mma

17 Ọ ga-aga nʼihu mgbe niile na-awụpụ ihe o ji ụgbụ ya gbute

na-ala mba niile nʼiyi, dịka o si masị ya, na-egosighị obi ebere ọbụla?

Veja também

Publicidade
Habacuque
Ver todos os capítulos de Habacuque
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-