17 " ‘Chineke sịrị, nʼoge ikpeazụ,
aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m.
Ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma,
ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ,
ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ.
18 Ọ bụladị ndị ohu m, nwoke ha na nwanyị nʼime ha,
ka m ga-awụkwasị Mmụọ m.
Ha ga-ebukwa amụma.
19 Aga m egosi ihe ịtụnanya na mbara eluigwe,
gosikwa ihe ịrịbama nʼụwa na nʼokpuru ụwa,
ọbara na ọkụ na alulu anwụrụ ọkụ.
20 Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị,
ọnwa ga-aghọkwa ọbara,
tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa ebube.
21 Ọ ga-erukwa, na onye ọbụla nke na-akpọku
aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta.’2:21 Jul 2:28-32