42 Ma Chineke chepuru ihu ya site nʼebe ha nọ. Ọ rara ha nye ikpere usuu ihe dị nʼeluigwe.7:42 Anyanwụ, ọnwa na kpakpando dị iche iche Nke a dabara nʼihe e dere nʼakwụkwọ ndị amụma,
" ‘Unu ụlọ Izrel, unu o wetara m onyinye anụ e gburu egbu ka ọ dị aja7:42 Ọ bụ aja unu chụrụ m unu chụụrụ m
iri afọ anọ unu nọrọ nʼọzara?
43 Unu buliri ụlọ ikwu nke Mọlọk
na kpakpando nke chi unu bụ Refan,
bụ arụsị ndị ahụ unu mere ịkpọ isiala nye ha.
Ya mere, aga m ewezuga unu, burukwa unu gaa nʼofe obodo Babilọn.’7:43 Ems 5:25-27