44 "Ndị nna nna anyị ha nwere ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ nʼọzara. E mere ya site na ntụziaka na usoro ihe atụ Chineke gosiri Mosis. 45 Mgbe Joshua duuru nna nna anyị ha nweta ala ndị mba ọzọ ndị Chineke chụpụrụ. E butekwara igbe ọgbụgba ndụ a nʼala ahụ. Ọ nọgidekwara nʼala ahụ tutu ruo nʼoge Devid. 46 Onye chọtara ihuọma nʼebe Chineke nọ, ma rịọ ka o wuore Chineke nke Jekọb ebe obibi. 47 Ma ọ bụ Solomọn wuru ya ụlọ ahụ.
48 "Otu ọ dị, Onye kachasị ihe niile elu adịghị ebi nʼụlọ e ji aka wuo, dịka onye amụma kwuru,
49 " ‘Eluigwe bụ ocheeze m.
Ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m.
Ụdị ụlọ dị aṅaa ka unu ga-ewuru m?
Maọbụ ebee ka ebe izuike m ga-adị?
Ka Onyenwe anyị kwuru.
50 Ọ bụghị aka m mere ihe ndị a niile?’7:50 Aịz 66:1,2