32 Mpaghara akwụkwọ nsọ ọ na-agụ bụ nke a,
"E duuru ya dị ka atụrụ gaa nʼebe a ga-egbu ya.
Dịka nwa atụrụ na-anọ nwayọọ nʼihu onye na-akpacha ya ajị,
otu a ka ọ na-emegheghị ọnụ ya.
33 Nʼọnọdụ ịdị ala ya, e meghị ka ikpe ziri ezi ruo ya aka.
Onye ga-akọ akụkọ banyere agbụrụ ya?
Nʼihi na e sitere nʼụwa wepụ ndụ ya."8:33 Aịz 53:7,8
34 Onozi ahụ jụrụ Filip, "Biko, gwa m, onye ka onye amụma a na-ekwu okwu ya? Ọ bụ ihe banyere onwe ya ka ọ na-ekwu, ka ọ bụ banyere onye ọzọ?" 35 Mgbe ahụ, Filip malitere ikwu okwu, site nʼakụkọ akwụkwọ nsọ ọ na-agụ kọọrọ ya akụkọ oziọma banyere Jisọs.