2 E ji m obi ụtọ, na-eme ka unu mata ihe ịrịbama niile na ihe iju anya niile, nke Chineke Onye kachasị ihe niile elu meere m.
3 Lee ka ihe ịrịbama ya,
na ihe ịtụnanya ya si dị ukwuu!
Alaeze ya bụ nke na-adị site ebighị ebi ruo ebighị ebi;
ọchịchị ya na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.