Ikpere chi ndị ọzọ
1 Ọ bụrụ na onye amụma, maọbụ onye na-akọwa nrọ apụta nʼetiti gị kwee nkwa na ihe ịrịbama maọbụ ihe dị ebube na-aga ime, 2 ọ bụrụkwa na ihe ịrịbama ahụ maọbụ ihe ebube ahụ e kwuru maka ya emezuo, emesịa onye amụma ahụ na-asị, "Ka anyị gbaso chi ndị ọzọ dị iche, ka anyị feekwa ha," bụ chi ndị ị na-amaghị, 3 egela okwu onye amụma maọbụ ọrọ nrọ ahụ ntị. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu na-ele unu ule ịmata ma unu jikwa obi unu, na uche unu hụ ya nʼanya. 4 Ọ bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu ka unu ga-eso, naanị ya ka unu ga-atụ egwu. Debenụ iwu ya niile na-erubekwara ya isi, na-ejere ya ozi, jidesiekwa ya ike.