Publicidade

Deuteronômio 15

Afọ inwere onwe

1 Nʼọgwụgwụ afọ asaa ọbụla, ga-akagbu ụgwọ niile mmadụ ji gị. 2 Otu a ka a ga-esi mee ya: Onye ọbụla e ji ụgwọ ga-akagbu ụgwọ niile onye Izrel ibe ya ji ya. gaghị elekwa anya na onye agbataobi ya maọbụ nwanna ya ga-akwụ ya ụgwọ ahụ, nʼihi na oge a na-ekwusa mgbaghara ụgwọ Onyenwe anyị eruola. 3 Mgbaghara a erughị nʼebe ndị ọbịa nọ,15:3 Ndị ọbịa kwesiri ịkwụ ụgwọ a, nʼihi na ha adịghị eso ụmụ Izrel na-ahapụ ala ha ka o zuo ike nye Onyenwe anyị, mgbe afọ asaa ruru. Ya mere, ha nwere ego ịkwụ ụgwọ ha ji. Lev 25:1-7 ma ghaghị ịkagbu ụgwọ ọbụla nwanna gị ji gị. 4 Otu dị, o kwesighị ka ndị ogbenye dịrị nʼetiti gị, nʼihi nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị ka inweta dịka ihe nketa gị, ga-agọzi gị nke ukwuu, 5 ma bụrụ na i rube isi nye Onyenwe anyị Chineke gị, ma lezie anya debe iwu ndị a niile m na-enye gị taa. 6 Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị dịka o kwere na nkwa. ga-agbazinye ọtụtụ mba ego, gaghị anọ nʼụkọ! ga-achị ọtụtụ mba, ma ha agaghị achị gị.

7 Ma mgbe banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye gị, a sị na e nwee onye ogbenye nʼetiti gị, nke bụ onye Izrel ibe gị, gaghị emechi obi gị maọbụ kechie aka gị megide ya, 8 ghaghị ịgbazinye ya ihe dị ka o si chọọ. 9 Lezie anya ka ghara inwe ụdị echiche ọjọọ a nʼobi gị sị, "Afọ mgbaghara ụgwọ na-abịa nso," nʼihi ya, i kechie obi gị jụ ibinye nwanna gị nọ na mkpa ihe chọrọ. bụrụ na onye ahụ nọ na mkpa akwaa akwa kpọkuo Onyenwe anyị, a ga-agụ gị dịka onye ikpe mmehie mara. 10 ghaghị inye ha site nʼafọ ofufu, meekwa nke a na-enweghị obi ilu, mgbe ahụ, nʼihi nke a, Onyenwe anyị bụ Chineke gị ga-agọzi gị nʼọrụ gị niile nakwa ihe niile nke tinyere aka na ya. 11 A ghaghị inwe ndị ogbenye nʼetiti unu, bụ ya mere iwu a jiri dị mkpa. Gbasapụ aka nʼebe nwanna gị na nʼebe ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa nọ.

Mmeso a na-emeso ndị ohu

12 bụrụ na onye Hibru ibe gị, ndị nwoke maọbụ ndị nwanyị, eresi gị onwe ha, gbakwaara gị odibo afọ isii, nʼafọ nke asaa, ghaghị ịhapụ ha ka ha nwere onwe ha. 13 Mgbe hapụrụ ụlọ gị, ezipụkwala ya nʼaka efu! 14 ga-esite nʼigwe anụ ụlọ gị, na nʼebe ịzọcha ọka gị, na nʼebe ịzọcha vaịnị gị, nye ya onyinye pụrụ iche iji sị ya laa nʼudo. Nye ya onyinye a dịka Onyenwe anyị Chineke gị si gọzie gị. 15 Cheta na bụrị ohu nʼala Ijipt ma Onyenwe anyị bụ Chineke gị gbapụtara gị. bụ nʼihi ya ka m ji na-enye gị iwu a taa.

16 Ma bụrụ na ohu gị asị gị, "Achọghị m ịhapụ gị," nʼihi na hụrụ gị na ndị ụlọ gị nʼanya, hụkwa na ihe na-agara gị na ya nke ọma, mgbe gị na ya nọ. 17 Were agịga kpọpuo ntị15:17 Ịkpọpu ntị bụ akara e ji amara onye bụ ohu na mgbe ochie. ya nʼọnụ ụzọ ụlọ gị. ga-abụkwara gị ohu ogologo ndụ ya niile. Otu aka ahụ kwa ka ga-eme ohu gị nwanyị.

18 Enwela obi mwute mgbe ọbụla na-ahapụ ohu gị ka o nwere onwe ya, nʼihi na ga-echeta na rụụrụ gị ọrụ afọ isii, ihe i mefukwara erughị ọkara ihe gaara eji goo ndị ọrụ. Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzikwa gị nʼihe niile na-eme.

Anụ ụlọ e bụ ụzọ mụọ

19 Nwa oke ehi ọbụla maọbụ nwa atụrụ ọbụla maọbụ nwa ewu ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼime igwe anụ ụlọ gị ka ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị Chineke gị, ejila nwa mbụ nke ehi gị e buru ụzọ mụọ arụ ọrụ ubi, akpachakwala ajị nwa ewu maọbụ nwa atụrụ ọbụla e buru ụzọ mụọ dị nʼime igwe ewu na atụrụ gị. 20 Gị na ezinaụlọ gị ga-eri anụ ndị a nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị afọ ọbụla nʼebe họpụtara. 21 Ma bụrụ na nwa anụ ọbụla e buru ụzọ mụọ nwere nkwarụ, dịka ngwụrọ maọbụ ìsì maọbụ nkwarụ ọbụla nke jọrọ njọ, gaghị eji ya achụ aja nye Onyenwe anyị Chineke gị. 22 Kama, ka bụrụ ihe oriri nye ezinaụlọ gị nʼime ụlọ gị. Onye ọbụla, ma ndị dị ọcha ma onye rụrụ arụ nʼoge ahụ ga-eri ya, dịka onye ọbụla pụrụ iri anụ ele maọbụ anụ mgbada. 23 Ma erila ọbara ya. Wụsa ya nʼala dịka mmiri.

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_12-11-46-