11 Ma Mosis rịọrọ Onyenwe anyị Chineke ya arịrịọ sị ya, "Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gịnị mere iwe gị ji dị ọkụ otu a nʼebe ndị gị nọ bụ ndị nke i ji ike ebube gị, na ọtụtụ ihe ịrịbama dị ịtụnanya, dupụta site nʼala Ijipt? 12 Nʼihi gịnị ka ndị Ijipt ga-ekwu sị, ‘Ọ bụghị ime ha ihe ọjọọ ka o ji dupụta ha, ka o nwee ike gbuo ha nʼugwu ndị a, ma kpochapụkwa ha site nʼelu ụwa a?’ Site nʼiwe gị dị ọkụ chigharịa, kwere ka ọ dajụọ. Chigharịakwaa site nʼatụmatụ ọjọọ a nʼebe ndị gị nọ. 13 Cheta nkwa ahụ i kwere ndị ohu gị bụ Ebraham, Aịzik, na Izrel. Nʼihi na i ji onwe gị ṅụọ iyi nye ha sị, ‘Aga m eme ka mkpụrụ gị mụbaa dịka kpakpando nke eluigwe. Aga m enye ha ala m kwere ụmụ ụmụ gị na nkwa ka ọ bụrụ ihe nketa ha ruo mgbe ebighị ebi.’ " 14 Ya mere, Onyenwe anyị gbanwere obi ya. Ọ lakwaghị ha nʼiyi.
Publicidade
Publicidade