6 Ebram zara Serai sị, "Lee, ohu gị nwanyị dị gị nʼaka. Jiri ya mee ihe ọbụla dị gị mma nʼanya." Nʼihi nke a, Serai mesiri ya ihe ike, nke mere ka o si nʼebe Serai nọ gbapụ.
7 Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị hụrụ ya nʼakụkụ isi iyi mmiri dị nʼọzara, nʼakụkụ ụzọ Shua, 8 jụọ ya sị, "Hega, ohu nwanyị Serai, olee ebe i si bịa, olee ebe ka ị na-ejekwa?"
Hega zara sị, "Ọ bụ site nʼihu nne m ukwu Serai ka m na-agba ọsọ."