23 Ebraham jeruru Onyenwe anyị nso jụọ ya sị, "Uche gị ọ bụ ikpochapụ ndị ezi omume na ndị ajọ omume? 24 Ọ bụrụ na ị chọta iri ndị ezi omume ise nʼime obodo ahụ, ị ga-ekpochapụ obodo ahụ? Ị gaghị agbaghara ya nʼihi iri ndị ezi omume ise nọ nʼime ya? 25 Ọ bụghị ezi ihe na ị ga-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi. Nʼihi na ị gaghị emeso ndị ezi omume dịka i si mesoo ndị na-eme ajọ ihe. O kwesighị ka onye ga-ekpe ụwa niile ikpe, kpee ikpe ziri ezi?"
26 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zara sị ya, "Ọ bụrụ na m achọta iri ndị ezi omume ise nʼobodo Sọdọm, aga m agbaghara obodo ahụ niile nʼihi ha."
27 Ebraham kwukwara ọzọ sị, "Ugbu a m nwere ike kwuwapụta okwu nʼihu Onyenwe anyị, mụ onye bụ naanị aja na ntụ. 28 Eleghị anya ọ bụrụ na e nweta naanị iri ndị ezi omume anọ na ise, ị ga-emebi obodo ahụ?"
Onyenwe anyị zara sị, "Agaghị m ebibi ya ma ọ bụrụ na m achọta iri mmadụ anọ na ise nʼime ya."
29 Ọzọkwa, ọ sịrị ya, "Ọ bụrụkwanụ na a ga-achọta naanị iri mmadụ anọ?"
Onyenwe anyị zara sị ya, "Nʼihi iri mmadụ anọ, agaghị m ebibi ya."
30 Mgbe ahụ ọ sịrị, "Biko, ka iwe hapụ iwe Onyenwe anyị ma m kwuo okwu. Eleghị anya, achọta naanị iri mmadụ atọ nʼebe ahụ?"
Onyenwe anyị zaghachiri sị ya, "Agaghị m emebi ya, ma ọ bụrụ na m achọta iri mmadụ atọ nʼime ya."
31 O kwuru sị, "Ebe ọ bụ na m amalitela ịgwa gị, Onyenwe anyị okwu, biko kwere ka m gaa nʼihu. Ọ bụrụ na a ga-achọta naanị iri mmadụ abụọ?"
Onyenwe anyị zara sị, "Nʼihi iri mmadụ abụọ ahụ agaghị m emebi ya."
32 Nʼikpeazụ, Ebraham kwuru sị, "Ka iwe hapụ iwe Onyenwe anyị. Ka m kwuo naanị otu ugboro a. Ọ bụrụkwanụ na a chọta naanị mmadụ iri nʼebe ahụ?"
Onyenwe anyị zara sị, "Nʼihi mmadụ iri ahụ, agaghị m ebibi ya."
33 Mgbe Onyenwe anyị gwachara Ebraham okwu, ọ hapụrụ ya gawa ebe ọ na-aga. Ebraham laghachiri azụ nʼụlọ ya.