Publicidade

Gênesis 18

23 Ebraham jeruru Onyenwe anyị nso jụọ ya sị, "Uche gị bụ ikpochapụ ndị ezi omume na ndị ajọ omume? 24 bụrụ na chọta iri ndị ezi omume ise nʼime obodo ahụ, ga-ekpochapụ obodo ahụ? gaghị agbaghara ya nʼihi iri ndị ezi omume ise nọ nʼime ya? 25 bụghị ezi ihe na ga-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi. Nʼihi na gaghị emeso ndị ezi omume dịka i si mesoo ndị na-eme ajọ ihe. O kwesighị ka onye ga-ekpe ụwa niile ikpe, kpee ikpe ziri ezi?"

26 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zara sị ya, "bụrụ na m achọta iri ndị ezi omume ise nʼobodo Sọdọm, aga m agbaghara obodo ahụ niile nʼihi ha."

27 Ebraham kwukwara ọzọ sị, "Ugbu a m nwere ike kwuwapụta okwu nʼihu Onyenwe anyị, mụ onye bụ naanị aja na ntụ. 28 Eleghị anya bụrụ na e nweta naanị iri ndị ezi omume anọ na ise, ga-emebi obodo ahụ?"

Onyenwe anyị zara sị, "Agaghị m ebibi ya ma bụrụ na m achọta iri mmadụ anọ na ise nʼime ya."

29 Ọzọkwa, sịrị ya, "bụrụkwanụ na a ga-achọta naanị iri mmadụ anọ?"

Onyenwe anyị zara sị ya, "Nʼihi iri mmadụ anọ, agaghị m ebibi ya."

30 Mgbe ahụ sịrị, "Biko, ka iwe hapụ iwe Onyenwe anyị ma m kwuo okwu. Eleghị anya, achọta naanị iri mmadụ atọ nʼebe ahụ?"

Onyenwe anyị zaghachiri sị ya, "Agaghị m emebi ya, ma bụrụ na m achọta iri mmadụ atọ nʼime ya."

31 O kwuru sị, "Ebe bụ na m amalitela ịgwa gị, Onyenwe anyị okwu, biko kwere ka m gaa nʼihu. bụrụ na a ga-achọta naanị iri mmadụ abụọ?"

Onyenwe anyị zara sị, "Nʼihi iri mmadụ abụọ ahụ agaghị m emebi ya."

32 Nʼikpeazụ, Ebraham kwuru sị, "Ka iwe hapụ iwe Onyenwe anyị. Ka m kwuo naanị otu ugboro a. bụrụkwanụ na a chọta naanị mmadụ iri nʼebe ahụ?"

Onyenwe anyị zara sị, "Nʼihi mmadụ iri ahụ, agaghị m ebibi ya."

33 Mgbe Onyenwe anyị gwachara Ebraham okwu, hapụrụ ya gawa ebe na-aga. Ebraham laghachiri azụ nʼụlọ ya.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-28_14-13-17-