17 Ma Chineke nụrụ ịkwa akwa nwantakịrị nwoke ahụ. Mmụọ ozi Chineke sikwa na mbara eluigwe kpọọ Hega oku sị ya, "Hega, gịnị na-eme gị? Atụla egwu, nʼihi na Chineke anụla21:17 Chineke anụla Maọbụ, Chineke na-anụ, bụ ihe Ishmel pụtara. olu akwa nwantakịrị ahụ nʼebe ahụ o dina. 18 Gaa kulite nwantakịrị ahụ kasịe ya obi, nʼihi na aga m eme ya ka ọ ghọọ mba dị ukwuu."
19 Mgbe ahụ, Chineke meghere anya ya, mee ka ọ hụ olulu mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ gara kujuo karama akpụkpọ ahụ mmiri, ma nye nwantakịrị ahụ mmiri ka ọ ṅụọ.