17 Ọ gwara Adam sị, "Nʼihi na ị ṅara nwunye gị ntị, rie mkpụrụ site nʼosisi ahụ m nyere gị iwu sị, ‘Gị erila mkpụrụ sitere na ya,’
"Ala bụ ihe a bụrụ ọnụ nʼihi gị,
site nʼoke ndọgbu nʼọrụ ka ị ga-eri ihe si na ya pụta
ogologo ụbọchị ndụ gị niile.
18 Ọ ga-erupụtara gị ogwu na uke,
ị ga-erikwa ahịhịa nke ubi.
19 Site nʼọsụsọ nke ga-agbapụta gị nʼihu
ka ị ga-eri nri gị
tutu ruo mgbe ị lọghachiri nʼala
ebe ọ bụ site nʼala ka e si mepụta gị
nʼihi na aja ka ị bụ,
nʼaja ka ị ga-alaghachikwa."