Ụmụnne Josef amara onye ọ bụ
1 Nʼoge a, Josef enwekwaghị ike ijite onwe ya aka nʼihu ndị na-ejere ya ozi. O welitara olu sị, "Zipụnụ onye ọbụla site nʼebe m nọ." Ya mere, o nweghị onye ya na Josef nọ mgbe ọ kọọrọ ụmụnne ya onye ọ bụ. 2 O tiri mkpu akwa nke ndị Ijipt nụrụ, na nke ndị ụlọ Fero nụkwara.
3 Josef gwara ụmụnne ya sị, "Mụ onwe m bụ Josef. Nna m ọ ka nọ ndụ ugbu a?" Ma ụmụnne ya enweghị ọnụ ha ji asa ya, nʼihi na oke egwu jidere ha nʼihu ya.