9 Ị bụ nwa ọdụm, gị, Juda,
i si nʼịchụ nta lọta, nwa m.
Dịka ọdụm, ọ na-amakpu, na-edina ala,
dịka nne ọdụm, onye ga-anwa anwa kpọtee ya?
10 Mkpanaka eze agaghị esite nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya,
maọbụ mkpanaka onyendu esi nʼagbata ụkwụ ya pụọ,
tutuu ruo mgbe eze ahụ nwe ya ga-abịa,
irube isi nke mba niile ga-abụ nke ya.