Pular para o conteúdo
Publicidade

Hebreus 10

Ọkpụkpọ oku banyere inwe mkpebi

19 Nʼihi nke a, ụmụnna m, ebe anyị nwere nkwuwa okwu ịbanye nʼEbe Kachasị Nsọ site nʼọbara Jisọs, 20 bụ ụzọ ọhụrụ nke o meghere nye anyị, nke dị ọhụrụ ma dịkwa ndụ site nʼakwa mgbochi ahụ nke bụ ahụ ya, 21 ebe anyị nwekwara onye nchụaja dị ukwuu, nke na-elekọta ụlọ Chineke, 22 ka anyị bịaruo nso site nʼobi dị ọcha, na ntụkwasị obi zuru ezu nke okwukwe, ka anyị bụrụ ndị a sachara obi ha site nʼakọnuche rụrụ arụ, ka anyị bụrụkwa ndị e ji mmiri dị ezigbo ọcha sachaa ahụ anyị.

Veja também