4 Nʼihi na ụlọ ọbụla nwere onye wuru ya, maọbụ Chineke na-ewu ihe niile. 5 Mosis kwesiri ntụkwasị obi dịka odibo nʼụlọ Chineke nʼihe niile,3:5 Ọnụ 12:7 sịkwa otu a gbaa ama banyere ihe ndị a ga-ekwu nʼọdịnihu. 6 Ma otu ọ dị, Kraịst kwesiri ntụkwasị obi dịka ọkpara nke na-elekọta ụlọ ya. Anyị gabụkwanụ ụlọ ya ma ọ bụrụ na anyị ejidesie okwukwe anyị ike ya na olileanya nke anyị ji anya isi.