Pular para o conteúdo
Publicidade

Ọnụọgụgụ 24

1 Nʼoge a, Belam aghọtala nʼuche ya na masịrị Onyenwe anyị ịgọzi Izrel. Ya mere, họrọghị ịgba afa dịka o mere nʼoge ndị gara aga, kama o chere ihu ya nʼọzara. 2 Mgbe Belam lepụrụ anya hụrụ ụmụ Izrel dịka ha si maa ụlọ ikwu nʼebo nʼebo. Mgbe ahụ kwa, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị ya. 3 O buru amụma ndị a sị,

"Okwu si nʼọnụ Belam nwa Beoa pụta,

okwu onye ahụ anya ya saghere asaghe.

4 Okwu onye ahụ na-anụ okwu Chineke

onye na-ahụ ọhụ site nʼaka onye pụrụ ime ihe niile.

Onye na-ada nʼala ma anya ya na-eghe oghe.

5 "Lee ka ebe obibi gị si maa mma, gị Jekọb,

ebe obibi gị niile, gị Izrel!

6 "Dịka ndagwurugwu dị iche iche ka ha gbasapụrụ,

dịka ubi a gbara ogige dị nʼakụkụ osimiri,

dịka osisi aloos nke Onyenwe anyị kụrụ,

dịka osisi sida dị nʼakụkụ mmiri.

7 Mmiri ga-esi nʼite mmiri ha na-erupụta,

mkpụrụ ha ga-enwekwa mmiri dị ukwuu.

"Eze ha ga-adị ukwuu karịa Agag,

a ga-ebulikwa alaeze ha elu.

8 "Chineke sitere nʼala Ijipt kpọpụta ha.

Ha nwere ike dịka atụ.

Ha ga-eripịa mba niile na-ebili imegide ha.

Ha ga-anyajisi ọkpụkpụ ha niile,

jirikwa ọtụtụ àkụ ha gbatuo ha.

9 Ha na-amakpuru, dinara ala dịka ọdụm,

dịka nne ọdụm, onye pụrụ ịkpọte ha?

"Ngọzị na-adịrị onye bụla na-agọzi gị,

ma ọbụbụ ọnụ na-adịrị onye ọbụla na-akọcha gị."

10 Iwe Balak dị ọkụ megide Belam nʼoge a. kụkọtara aka ya abụọ nʼiwe. Tie mkpu sị Belam, "Akpọrọ m gị ka bịa bụọrọ m ndị iro m ọnụ. Ma gọziela ha ugboro atọ a. 11 Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị! Laghachi nʼụlọ gị! Akwadobere m inye gị ọnọdụ dị elu, ma Onyenwe anyị e gbochiela gị inweta ụgwọ ọrụ a."

12 Belam zara Balak sị, "bụ na m agwaghị ndị ozi gị niile, bụ ndị zitere m, 13 na a sịkwarịị na Balak enye m ọlaọcha na ọlaedo niile nke dị nʼụlọeze ya, apụghị m ime ihe ọbụla nʼike aka, maọbụ ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ, gabiga iwu Onyenwe anyị. bụkwa naanị ihe Onyenwe anyị na-ekwu ka m ga-ekwu? 14 Ugbu a, ana m alakwuru ndị m, ma bịa, ka m dọọ gị aka na ntị banyere ihe ndị a ga-eme ndị gị nʼụbọchị ndị a na-abịa nʼihu."

Amụma Belam nke anọ

15 Ya mere Belam kwuru okwu ndị a:

"Amụma Belam nwa Beoa,

amụma nke onye ahụ anya ya nʼahụ ụzọ nke ọma,

16 amụma onye ahụ nke na-anụ okwu Chineke,

onye ihe ọmụma ya si nʼebe Onye kachasị ihe niile elu na-abịa.

Onye na-ahụ ọhụ site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.

Onye na-ada nʼala, ma anya ya abụọ ghekwa oghe.

17 "Ana m ahụ ya, ma bụghị ugbu a,

ana m ele ya anya, ma nọghị nso.

Otu kpakpando ga-esi nʼime Jekọb zolie.

Mkpara eze ga-esi nʼetiti Izrel bilie.

ga-etipịa egedege ihu ndị Moab,

na okpokoro isi ndị ikom Shet niile.

18 A ga-emeri Edọm,24:18 Ndị Edọm si nʼagbụrụ Ịsọ. Jen 36:1-9

Sia, onye iro ya, ka a ga-emeri nʼagha.

Ma Izrel ga-eto, ghọọ onye dị ike.

19 Otu onye ọchịchị ga-esi na Jekọb pụta.

Bibie ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ."

Amụma Belam nke ise

20 Mgbe ahụ, Belam lepụrụ anya legide ụlọ ndị Amalek niile, buo amụma banyere ha sị:

"Amalek bụ mba mbụ nʼetiti mba niile,

ma ikpeazụ ya bụ mbibi!"

Amụma Belam nke isii

21 hụrụ ndị Ken anya, kwuo okwu ya:

"E, i bi ugbu a nʼebe e wusiri ike,24:21 Ya bụ nke nʼadịgide adịgide

akwụ gị dị nʼime oke nkume ahụ!

22 Ma, a ga-ebibi unu ndị Ken niile,

mgbe Ashọ ga-adọta unu nʼagha."

Amụma Belam nke asaa

23 Ndị a bụ okwu o ji mechie amụma ya:

"Onye ga-adị ndụ mgbe Chineke ga-eme ihe ndị a?

24 Ụgbọ mmiri ga-esi nʼọnụ mmiri Saiprọs bịa.

Ha ga-eji ike dobe ndị Eba24:24 Eba bụ nna nna ndị Hibru. Jen 10:21; 1Ih 1:25-27 na ndị Ashọ nʼokpuru ha,

ma a ga-ebibikwa ha onwe ha."

25 Emesịa, Belam biliri laghachi nʼụlọ ya, ma Balak gbasoro ụzọ nke ya.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também