Pular para o conteúdo
Publicidade

Hebreus 8

6 Ma otu dị, natara ọrụ ije ozi karịrị nke ha, dị ka onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ dị elu karịa nke ochie, ebe ọgbụgba ndụ nke ọhụrụ a o mere ka dịrị nʼetiti ya na mmadụ dabeere na nkwa dị mma karịa.

7 bụrụ na ọgbụgba ndụ ochie ahụ zuruoke, garaghị aba uru ka achọwa ọgbụgba ndụ ọzọ. 8 Ma Chineke chọpụtara ezughị oke ha mgbe sịrị,

"Lee, oge na-abịa, ka Onyenwe anyị kwupụtara,

mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ

dịrị nʼetiti mụ na ụlọ Izrel,

nakwa ụlọ Juda.

9 bụghị ụdị ọgbụgba ndụ

mụ na nna nna ha gbara,

mgbe m jidere ha nʼaka

site nʼala Ijipt dupụta ha,

nʼihi na ha anọgideghị bụrụ ndị kwesiri ntụkwasị obi idebe ọgbụgba ndụ m.

Nʼihi ya, echepụrụ ihu m nʼebe ha nọ,

ka Onyenwe anyị kwupụtara.

10 Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ m ga-eme ka dịrị nʼetiti mụ onwe m na ụlọ Izrel,

mgbe oge ndị ahụ gasịrị, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Aga m etinye iwu m nʼime uche ha,

dekwasị ya nʼobi ha.

Aga m abụ Chineke ha,

ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.

11 dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe,

maọbụ otu onye asị ibe ya, Mara Onyenwe anyị,

nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ,

site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu.

12 Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha,

agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ."8:12 Jer 31:31-34

13 Mgbe o kwuru okwu banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ, pụtara na nke ochie ahụ abụrụla ihe gabigara agabiga. Ihe dị ochie nke gabigara ga-emesịa ghara ịdịkwa.

Veja também