Pular para o conteúdo
Publicidade

Habakuk 2

1 Aga m arịgoro nʼelu ebe nche m,

guzo onwe m nʼebe nchekwa ahụ.

Aga m echerekwa ịhụ ihe ọ ga-agwa m,

na ihe m ga-asa, banyere mkpesa ndị a.

Ọsịsa Onyenwe anyị

2 Mgbe ahụ Onyenwe anyị zara m sị,

"Dee ọhụ2:2 Ya bụ, ọsịsa ahụ nʼelu mbadamba nkume e ji ede ihe.

Depụta ya nke ọma,

ka onye na-agba ọsọ nwee ike ịgụ ya.

3 Nʼihi na e nwere ọhụ nke ga-adị ruo oge a kara aka,

ọ na-ekwu banyere oge ọgwụgwụ,

Ọ gaghị abụkwa ụgha.

Ọ bụrụ na ọ dịka mmezu ya adịghị abịaru ọsịịsọ, chere mmezu ya,

nʼihi na ọ ga-emesịa mezuo,

ọ gaghị anọ tee aka.

4 "Lee, onye iro na-afụli onwe ya elu;

ọchịchọ ya ezikwaghị ezi

ma onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe2:4 Maọbụ, ikwesi ntụkwasị obi ya dị ndụ.

5 Nʼezie, mmanya2:5 Nʼakwụkwọ ụfọdụ ihe ị ga-ahụ bụ akụnụba. na-eduhie ya ụzọ,

onye jupụtara na nganga, na-adịghị enwe ezumike.

Ebe ọ bụ na o nwere anya ukwu dịka ala mmụọ,

ọ gaghị enwekwa afọ ojuju dịka ọnwụ.

Nʼihi na ọ na-achịkọta mba niile nye onwe ya,

ọ na-adọtakwa ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha.

6 "Ndị a niile ha agaghị eji ịkwa emo na nkọcha sị ya,

" ‘Ahụhụ dịrị onye ahụ na-atụkọta ihe e zutere nʼohi,

ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-eme onwe gị ọgaranya

site nʼịnara ndị mmadụ ụgwọ nʼike?’

7 Ọ bụ na ndị i ji ụgwọ agaghị abịakwasị gị na mberede?

Ọ bụ na ha agaghị eteta nʼụra, mee gị ka ị maa jijiji?

Mgbe ahụ ka ha ga-eji gị mee ihe ha chọrọ.

8 Nʼihi na ị kwakọtala akụ nke ọtụtụ mba dị iche iche,

ndị ahụ fọdụrụ ga-abịakwa kwakọrọ ihe niile i nwere.

Nʼihi na ị wụsịala ọbara ndị mmadụ,

i bibiela ọtụtụ ala na obodo na ndị niile bi nʼime ha.

9 "Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọ ya site nʼuru ọjọọ,

nke na-ewukwasị akwụ ya nʼebe dị elu,

nʼihi ịgbanarị mbibi nke ga-abịa.

10 I sitela nʼizuzu ọjọọ gị mee ka mbibi bịakwasị ọtụtụ mmadụ,

sị otu a tufuo ndụ gị, ma wetakwara ezinaụlọ gị ihere.

11 Ọ bụladị nkume ahụ e ji wuo mgbidi ga-eti mkpu megide gị.

Osisi e ji doo elu ụlọ ga-etikwa mkpu akwa za nkume ndị ahụ.

12 "Ahụhụ dịrị onye ahụ na-eji ọbara ewu obodo,

nke na-ejikwa ajọ omume eme ka obodo ahụ guzosie ike.

13 Ọ bụ na ọ bụghị uche Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,

na ndọgbu nʼọrụ niile nke mmadụ bụ na nkịtị, ihe e ji afụnwu ọkụ,

na oke ọrụ niile nke mba dị iche iche bụ ihe lara nʼiyi?

14 Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke ebube Onyenwe anyị,

dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri.

15 "Ahụhụ dịrị onye ahụ na-enye onye agbataobi ya mmanya,

nke na-anọgide na-agbanyere ya mmanya tutu ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya,

ka o si otu a hụ ọtọ ya anya.

16 Ihere ga-anọchi otuto na nsọpụrụ i nwere.

Ṅụọ ka ị bụrụ onye mmanya na-egbu.

Nʼihi na iko dị nʼaka nri Onyenwe anyị na-abịakwute gị.

Ihere ga-anọchikwa anya otuto gị.

17 Ihe ike ahụ i mere Lebanọn ga-abịakwasịkwa gị.

Mbibi i bibiri anụmanụ dị iche iche ga-emekwa ka egwu ju gị obi.

Nʼihi na ị wụsịala ọbara ọtụtụ mmadụ,

bibie ala na obodo dị iche iche, bibiekwa ndị niile bi nʼime ha.

18 "Gịnị bụ uru arụsị bara ebe ọ bụ aka mmadụ kpụrụ ya?

Kedụ uru igwe a kpụrụ akpụ bara, bụ nke na-ekwu okwu ụgha?

Nʼihi na onye na-atụkwasị ha obi na-atụkwasị obi ya nʼihe ahụ aka ya rụpụtara,

nʼihi na ọ bụ arụsị na-enweghị ike ikwu okwu ka o mere.

19 Ahụhụ dịrị onye ahụ na-agwa osisi okwu sị, ‘Dịrị ndụ.’

Ma ọ bụ nkume nke na-apụghị ikwu okwu, ‘Teta nʼụra.’

O nwere ike izi mmadụ ihe?

Lee, ọ bụ ihe eji ọlaọcha na ọlaedo machie,

ma ọ dịghị nkuume ọbụla dị nʼime ya."

20 Ma Onyenwe anyị nọ nʼime ụlọnsọ ukwu ya.

Ya mere, ka ụwa niile dere duu nʼihu ya.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Habacuque
Ver todos os capítulos de Habacuque