Pular para o conteúdo
Publicidade

João 15

Ezi osisi vaịnị na alaka ya

1 "Mụ onwe m bụ ezigbo osisi vaịnị ahụ. Nna m bụkwa onye ọrụ ubi. 2 na-egbuda alaka ọbụla dị nʼime m nke na-adịghị amị mkpụrụ. Ma alaka ọbụla na-amị mkpụrụ ka na-egbucha, ka o nwee ike mịa mkpụrụ dị ọtụtụ. 3 Ugbu a, e meela ka unu dịrị ọcha nʼihi okwu m gwara unu. 4 Nọgidenụ nʼime m, ka mụ onwe m nọgidekwa nʼime unu. Dịka alaka ọbụla apụghị ịmị mkpụrụ nʼonwe ya ma bụrụ na nọgideghị nʼosisi vaịnị. Otu a, unu apụghịkwa ịmị mkpụrụ ma bụrụ na unu anọgideghị nʼime m.

5 "Mụ onwe m bụ osisi vaịnị ahụ; unu bụkwa alaka ya. Onye ọbụla na-anọgide nʼime m, nke mụ onwe m na-anọgidekwa nʼime ya, na-amị ọtụtụ mkpụrụ. Nʼihi na ewezuga m, unu enweghị ike ime ihe ọbụla.

Veja também