Pular para o conteúdo
Publicidade

Jọn 20

Jisọs egosi Meri Magdalin onwe ya

11 Ma Meri guzo nʼakụkụ ili ahụ na-ebe akwa. Mgbe nọ na-ebe akwa, o hulatara ala nyoo anya nʼime ili ahụ 12 hụ ndị mmụọ ozi abụọ yi uwe ọcha, ka ha nọdụrụ ala otu nʼisi, nke ọzọ nʼụkwụ, nʼebe ahụ atọgbọrọ ahụ Jisọs.

13 Ha sịrị ya, "Nwanyị, gịnị mere i ji ebe akwa?"

sịrị ha, "Ha ebupụla Onyenwe m, amaghị m ebe ha bujere ya." 14 Nʼoge a, tụgharịrị hụ ka Jisọs guzo nʼebe ahụ. Ma mataghị na bụ Jisọs.

15 Jisọs sịrị ya, "Nwanyị, gịnị mere iji ebe akwa? Onye ka na-achọ?"

Ebe o chere na bụ onye na-elekọta ogige ahụ, sịrị ya, "Nna anyị ukwu, bụrụ na bụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe i debere ya ka m gaa buru ya."

16 Jisọs sịrị ya, "Meri."

tụgharịrị tie mkpu nʼolu Hibru sị ya, "Raboni!" (nke pụtara "Onye nkuzi.)"

17 Jisọs sịrị ya, "Emetụkwala m aka nʼihi na alakwurubeghị m Nna m. Kama gakwuru ụmụnna m gwa ha, Ana m alakwuru Nna m na Nna unu. Chineke m na Chineke unu.’ "

18 Meri Magdalin gara gwa ndị na-eso ụzọ ya, "Ahụla m Onyenwe anyị." kọọrọ ha na bụ ya gwara ya ihe ndị a niile.

Veja também