Jisọs egosi Meri Magdalin onwe ya
11 Ma Meri guzo nʼakụkụ ili ahụ na-ebe akwa. Mgbe ọ nọ na-ebe akwa, o hulatara ala nyoo anya nʼime ili ahụ 12 hụ ndị mmụọ ozi abụọ yi uwe ọcha, ka ha nọdụrụ ala otu nʼisi, nke ọzọ nʼụkwụ, nʼebe ahụ atọgbọrọ ahụ Jisọs.
13 Ha sịrị ya, "Nwanyị, gịnị mere i ji ebe akwa?"
Ọ sịrị ha, "Ha ebupụla Onyenwe m, amaghị m ebe ha bujere ya." 14 Nʼoge a, ọ tụgharịrị hụ ka Jisọs guzo nʼebe ahụ. Ma ọ mataghị na ọ bụ Jisọs.
15 Jisọs sịrị ya, "Nwanyị, gịnị mere iji ebe akwa? Onye ka ị na-achọ?"
Ebe o chere na ọ bụ onye na-elekọta ogige ahụ, ọ sịrị ya, "Nna anyị ukwu, ọ bụrụ na ọ bụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe i debere ya ka m gaa buru ya."
16 Jisọs sịrị ya, "Meri."
Ọ tụgharịrị tie mkpu nʼolu Hibru sị ya, "Raboni!" (nke pụtara "Onye nkuzi.)"
17 Jisọs sịrị ya, "Emetụkwala m aka nʼihi na alakwurubeghị m Nna m. Kama gakwuru ụmụnna m gwa ha, ‘Ana m alakwuru Nna m na Nna unu. Chineke m na Chineke unu.’ "
18 Meri Magdalin gara gwa ndị na-eso ụzọ ya, "Ahụla m Onyenwe anyị." Ọ kọọrọ ha na ọ bụ ya gwara ya ihe ndị a niile.