Pular para o conteúdo
Publicidade

João 6

32 Jisọs sịrị ha, "Nʼezie, nʼezie agwa m unu, bụghị Mosis nyere unu achịcha ahụ site nʼeluigwe, kama bụ Nna m na-enye unu ezi achịcha ahụ site nʼeluigwe. 33 Nʼihi na achịcha Chineke bụ nke ahụ si nʼeluigwe rịdata, na-enyekwa ụwa ndụ."

34 Ha sịrị ya, "Nna anyị ukwu, nye anyị ụdị achịcha a site ugbu a gawa."

35 Jisọs sịrị ha, "Abụ m achịcha ahụ na-enye ndụ. Onye ọbụla na-abịakwute m, agụụ agaghị agụ ya. Onye ọbụla kwa kweere na m, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ.

Veja também