28 O jekwuru ya sị ya, "Ekele! Gị onye ihuọma dịkwasịrị. Onyenwe anyị nọnyekwara gị."
29 Ma obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu nʼihi okwu ya. O bidokwara ịtụgharị nʼuche ya ihe ekele a pụtara. 30 Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ya, "Atụla egwu Meri, nʼihi na i chọtala ihuọma nʼebe Chineke nọ. 31 Ma lee ị ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa aha ya Jisọs.