Ilu banyere ezi onye agbataobi
25 Otu ụbọchị, otu onye ozizi iwu biliri ịnwale ya. Ọ jụrụ ya, "Onye ozizi, gịnị ka m kwesiri ime ka m keta ndụ ebighị ebi?"
26 Ọ sịrị ya, "Gịnị ka e dere nʼiwu? Gịnị ka ị gụtara nʼime ya?"
27 Ọ zara sị, " ‘Ị ga-eji obi gị niile, na mkpụrụobi gị niile, na ike gị niile, na uche gị niile, hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya’; ma ‘hụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’10:27 Dit 6:5; Lev 19:18"
28 Ọ sịrị ya, "Ị zara nke ọma. Gaa mee nke a ị ga-adị ndụ."