Publicidade

Lucas 13

Ọgwụgwọ onye ọrịa nʼụbọchị izuike

10 Nʼụbọchị izuike ndị Juu, banyere nʼime otu ụlọ ekpere na-ezi ihe. 11 Otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye mmụọ nrịa nrịa mere ka ahụ ghara dị ya ike afọ iri na asatọ. na-ehu ehu, o nwekwaghị ike iguzo ọtọ kwem. 12 Mgbe Jisọs hụrụ ya, kpọrọ ya sị ya, "Nwanyị emeela ka i nwere onwe gị site nʼọrịa gị." 13 Mgbe o bikwasịrị ya aka, ngwangwa, o guzooro kwem malite na-eto Chineke.

14 Ma onyendu ụlọ ekpere ahụ were iwe nke ukwuu nʼihi na Jisọs gwọrọ ọrịa nʼụbọchị izuike. gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, "E nwere ụbọchị isii nʼime izu ụka mgbe mmadụ kwesiri ịrụ ọrụ. Ya mere, bịanụ ka a gwọọ unu nʼụbọchị ndị a, bụghị nʼụbọchị izuike."

15 Ma Onyenwe anyị zara ya sị, "Unu ndị ihu abụọ! dị onye nʼime unu na-adịghị atọpụ oke ehi ya maọbụ ịnyịnya ibu ya, site nʼụlọ anụmanụ, kpụpụ ya ebe ga-aṅụ mmiri nʼụbọchị izuike? 16 O kwesighị ka a tọpụ nwanyị a bụ ada Ebraham nʼagbụ ekwensu kere ya ogologo afọ iri na asatọ, nʼụbọchị izuike, mee ka o nwere onwe ya?"

17 Mgbe o kwuru nke a, ihere mere ndị iro ya niile, ma ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọrụ ebube niile na-arụ.

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-