Publicidade

Lucas 18

Ilu banyere ịnọgidesi ike

1 Mgbe ahụ tụụrụ ha ilu a iji gosi ha mkpa dị ikpe ekpere na-esepụghị aka, 2 sịrị, "O nwere otu ọkaikpe bi nʼotu obodo ma naghị atụ egwu Chineke. naghị asọpụkwara mmadụ. 3 Nʼobodo ahụkwa, e nwere otu nwanyị di ya nwụrụ anwụ nke na-abịakwute ya, na-asị ya, Kpepụta m nʼaka ndị na-emegide m.

4 "Na mmalite, chọghị, ma nʼikpeazụ, gwara onwe ya sị, bụ eziokwu na anaghị m atụ egwu Chineke maọbụ sọpụrụ mmadụ. 5 Ma nʼihi na nwanyị a di ya nwụrụ anwụ nọgidere na-enye m nsogbu, aga m ahụ na o nwetara ikpe ziri ezi, ka kwụsị inye m nsogbu site na ọbịbịa na-abịa.’ "

6 Ya mere Onyenwe anyị sịrị, "Gerenụ ihe ọkaikpe nke na-eme ajọ omume na-ekwu. 7 bụ na Chineke agaghị ekpepụta ndị ahụ họpụtara, bụ ndị na-akpọku ya ehihie na abalị? ga-anọ tee anya nʼinyere ha aka? 8 Asị m unu, ga-eme ngwangwa hụ na ha nwetara ikpe ziri ezi. Ma otu dị, mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa, ga-ahụkwa ndị nwere okwukwe nʼime ụwa?"

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_12-11-46-