Pular para o conteúdo
Publicidade

Luk 2

I kubata Jisọs nʼime ụlọnsọ

22 Mgbe oge zuru maka mmemme nke ịdị ọcha dị ka iwu Mosis siri dị, ha kutere ya na Jerusalem iche ya nʼihu Onyenwe anyị 23 (dịka e dere ya nʼiwu nke Onyenwe anyị, "Nwa mbụ ọbụla nke bụ nwoke ka a ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị"2:23 Ọpụ 13:2,12), 24 ha chụrụ aja dị ka e nyere nʼiwu Onyenwe anyị: "Ụmụ kpalakwukwu abụọ maọbụ ụmụ nduru abụọ."2:24 Lev 12:8

25 Ma lee, e nwere otu nwoke bi na Jerusalem aha ya bụ Simiọn, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. bụ onye ezi omume bụrụkwa onye ji obi ya niile na-efe Chineke. bụkwa onye na-ele anya maka nkasiobi nke ndị Izrel. 26 Ma Mmụọ Nsọ Chineke mere ka mata na gaghị anwụ ruo mgbe hụrụ Kraịst nke Onyenwe anyị. 27 Site nʼodudu nke Mmụọ Nsọ, batara nʼụlọnsọ ukwu, ma mgbe nne na nna nwata ahụ bụ Jisọs kubatara ya dị ka omenaala iwu si dị, 28 Simiọn kuuru ya nʼaka, kelee Chineke sị,

29 "Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe dị ka i kwere na nkwa,

ugbu a zilaga nwaodibo gị nʼudo.

30 Nʼihi na anya m ahụla nzọpụta gị,

31 nke i kwadoro nʼihu mba niile.

32 Ìhè nke ga-egosi ndị mba ọzọ ụzọ,

na ebube nke ndị gị Izrel."

33 O juru nne na nna nwantakịrị ahụ anya ịnụ ihe ndị a e kwuru banyere ya. 34 Mgbe ahụ, Simiọn gọziri ha, sịkwa Meri nne ya, Lee, "Nwatakịrị a bụ onye e zitere ka bụrụ ọdịda na mbili nye ọtụtụ mmadụ nʼIzrel, ga-abụkwa ihe ama nke ọtụtụ ga-ekwujọ. 35 bụkwa site nʼụzọ dị otu a ka a ga-ekpughe echiche nke dị ọtụtụ nʼobi. Mma agha ga-adụwakwa mkpụrụobi nke gị onwe gị."

36 O nwekwara onye amụma nwanyị, aha ya bụ Ana, ada Fanuel nke si nʼebo Asha. bụ ezigbo agadi nwanyị na-enweghị di, nʼihi na di ya nwụrụ mgbe ha biri naanị afọ asaa. 37 nọọla dị ka nwanyị na-enweghị dị iri afọ asatọ na anọ. hapụghị ụlọnsọ, kama nọgidere nʼefe ofufe ehihie na abalị, na-ibu ọnụ na-ekpe ekpere. 38 Nʼoge ahụ bịarutere nʼebe ha nọ, nye Chineke ekele, kwuo okwu banyere nwantakịrị ahụ nye ndị niile na-ele anya maka mgbapụta Jerusalem.

Veja também