Pular para o conteúdo
Publicidade

Lucas 22

Pita agọnarị Jisọs

54 Mgbe ahụ ha jidere ya duru ya pụọ, gaa nʼụlọ onyeisi nchụaja. Pita sokwara ha nʼazụ kama nọ nʼebe dị anya. 55 Mgbe ha kwanyere ọkụ nʼetiti mbara ezi obi ahụ, ma nọdụ ala gba ọkụ ahụ gburugburu, Pita sokwara ha nọdụ ala. 56 Ka na-anya ọkụ ahụ, otu nwaagbọghọ na-eje ozi hụrụ ya, o leruru ya anya nke ọma, sị, "Onye a na Jisọs nọkọrọ."

57 Ma gọrọ agọ sị, "Nwanyị, amaghị m onye bụ."

58 Mgbe oge nta gasịrị, onye ọzọ hụkwara ya kwukwaa sị, "Gị onwe gị bụkwa otu onye nʼime ha."

Ma Pita kwuru sị, "Nwoke m, abụghị m."

59 Mgbe ihe dị ka otu awa gafere, onye ọzọ bịakwara kwusie okwu ike, "Nʼezie, nwoke a so ya nʼihi na bụ onye Galili."

60 Pita sịrị, "Nwoke m, amaghị m ihe na-ekwu maka ya?" Dị ka kpụ okwu ahụ nʼọnụ, oke ọkpa kwara akwa. 61 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị tụgharịrị lee Pita anya. Pita chetakwara okwu Onyenwe anyị gwara ya nke bụ, "Tupu oke ọkpa akwa akwa taa, ga-agọnarị m ugboro atọ." 62 Ma pụrụ nʼezi gaa bee akwa na mwute.

Veja também