Pular para o conteúdo
Publicidade

Izikiel 28

Amụma megide eze Taịa

1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2 "Nwa nke mmadụ, gwa eze Taịa, Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị:

" Nʼihi nganga nke juru gị obi,

na-ekwu sị, "Mụ onwe m bụ chi,

mụ onwe m na-anọkwasị nʼocheeze nke otu chi,

nke dị nʼetiti oke osimiri niile."

Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, bụghị chi,28:2 Maọbụ, Chineke

bụ ezie na na-eche na mara ihe dịka chi.28:2 Maọbụ, Chineke

3 maara ihe karịa Daniel?

bụ na o nweghị ihe e zoro ezo nʼebe nọ?

4 I werela amamihe gị na nghọta gị

nwetara onwe gị akụ,

tụkọba ọlaedo na ọlaọcha,

nʼime ụlọakụ gị dị iche iche.

5 E, mmụta nʼịzụ ahịa gị

emeela ka ghọọ ọgaranya,

nʼihi akụnụba inwere

bụrụla onye na-akpa nganga.

6 " Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu;

" ebe bụ na gụrụ onwe gị dịka onye maara ihe

onye maara ihe dịka chi,

7 ana m aga ịkpọbata ndị mba ọzọ megide gị,

bụ mba kachasị mba niile dị iche iche njọ na-enweghị obi ebere.

Ha ga-amịpụta mma agha ha megide ịma mma gị na amamihe gị,

ha ga-adụwakwa ebube nke mma gị.

8 Ha ga-eme ka rịdaruo nʼolulu nke ala mmụọ.

ga-anwụ ọnwụ ike

nʼetiti oke osimiri niile.

9 Mgbe nke a mere, ga-asị, "Mụ onwe m bụ chi,"

nʼihu ndị ahụ na-egbu gị?

Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, bụghị chi,

nʼaka ndị ahụ na-egbu gị.

10 ga-anwụ ọnwụ dịka ndị a na-ebighị ugwu,

site nʼaka ndị ọbịa.

Mụ onwe m ekwuola, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ "

11 Okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị, sị, 12 "Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere eze Taịa ma gwa ya, Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,

" Gị onwe gị bụ akara izuoke,

jupụtara na amamihe na ịma mma.

13 nọ nʼIden,

nʼubi Chineke a gbara ogige.

Nʼebe ahụ ka e ji nkume dị oke ọnụahịa ndị a chọọ gị mma,

rubi,28:13 Maọbụ, kanelien na topaazi, na emeralụdụ,

na krisolaịt, na ọniks, na jaspa,

na safaia, na tọkwọisi, na beril.

A rụnyere nkume ndị a niile nʼime ọlaedo.

bụkwa nʼụbọchị ahụ e kere gị ka e doziri ha.

14 Ahọpụtara m gị mee gị ka bụrụ cherub,

ọrụ ahụ e doro gị iche ịrụ.

bụ nʼugwu nsọ Chineke ka na-anọ,

na-ejegharịkwa nʼetiti nkume ndị ahụ na-acha ọkụ.

15 bụ onye na-enweghị ịta ụta

nʼụzọ gị niile site nʼụbọchị e kere gị,

tutu ruo mgbe a hụrụ ajọ omume nʼime gị.

16 Site nʼịba ụba nke ọzụzụ ahịa gị

ghọrọ onye na-eme ihe ike,

si otu a mehiekwa.

Nʼihi ya, esi m nʼugwu Chineke chụpụ gị, nʼihi adịghị nsọ gị.

Esitekwara m nʼetiti nkume ọkụ ndị ahụ chụpụ gị,

gị cherub na-ekpuchi ekpuchi.

17 Obi gị jupụtara na nganga

nʼihi ịma mma gị,

i mere ka amamihe gị

bụrụ ihe rụrụ arụ nʼihi ebube nke ịma mma gị.

Nʼihi ya, achụdara m gị, tụọ gị nʼala,

mee ka bụrụ ihe nlere anya nye ndị eze niile.

18 Nʼihi ọtụtụ mmehie gị, na ịzụ ahịa aghụghọ gị,

i meela ka ụlọnsọ gị niile ghọọ ihe rụrụ arụ.

Nʼihi ya, emere m ka ọkụ si nʼetiti gị pụta,

repịa gị.

Ka ghọọ ntụ nʼelu ala,

nʼihu ndị ahụ niile na-ele gị anya.

19 Ndị niile maara gị

ka ihe ndị a juru anya,

nʼihi na ghọọla ihe oke egwu.

laala nʼiyi ruo ebighị ebi.’ "

Amụma megide Saịdọn

20 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 21 "Nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe Saịdọn dị buo amụma megide ya, 22 ma kwuo, Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,

" Mụ onwe m na-emegide gị, gị Saịdọn,

nʼetiti unu ka m ga-egosipụta otuto m.

Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị

mgbe m mere ka ahụhụ dakwasị unu,

nʼime unu, a ga-anwapụta na m bụ onye dị nsọ.

23 Aga m ezite ajọ ọrịa na-efe efe, nke ga-emegide ya,

meekwa ka ọbara jupụta nʼokporoụzọ ya niile.

Ndị e gburu egbu ga-ada nʼime ya,

site na mma agha nke ga-abịakwasị ya nʼakụkụ niile.

Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

24 " Ụlọ Izrel agaghị enwekwa mba kpọrọ ha asị gbara ha gburugburu ndị dịka uke, nke na-adụ adụ, na ogwu nke na-egbu mgbu. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.

25 " Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ndị Izrel ga-alọghachi biri nʼala nke aka ha ọzọ, ala nke m nyere nna ha Jekọb ohu m. Nʼihi na aga m esite na mba niile ha gbasasịrị chịkọtaa ha, si otu a gosi mba niile nke ụwa ịdị nsọ m. 26 Ha ga-ebi nʼala a na ntụkwasị obi. Ha ga-ewu ụlọ, kụọ ubi vaịnị, birikwa na-atụghị egwu ọbụla. Mgbe m pịachara mba niile dị ha gburugburu ụtarị, bụ mba ndị ahụ mekpara ha ahụ, mgbe ahụ, ha ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha.’ "

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também