Pular para o conteúdo
Publicidade

Izikiel 27

Abụ akwa nʼihi Taịa

1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2 "Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere Taịa, 3 sị ya, gị oke obodo dị nʼọnụ oke osimiri, onye bụ onye ahịa nke mba niile dị nʼọnụ osimiri. Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru:

" Gị onwe gị, bụ Taịa, na-asị,

"Ezuru m oke nʼịma mma."

4 I meela ka oke ala gị dịrị nʼetiti oke osimiri.

Ndị wuru gị emeekwala ka ịma mma gị zuo oke.

5 Osisi e ji wuo ahụ ụgbọ gị

sitere nʼosisi junipa nke si Senia;

bụkwa osisi sida nke si Lebanọn

ka e ji jidesie ihu ụgbọ ahụ ike.

6 Osisi ook nke si Bashan

ka e ji mee ụmara gị niile.

Osisi e si Saiprọs bubata

ka e ji wuo ala ụgbọ gị, jirikwa ọdụ machie ya nʼọnọdụ ịchọ ya mma.

7 Ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke e si Ijipt bubata,

ka e ji mee ọkọlọtọ gị.

Akwa ndo gị bụkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ, na odo odo,

nke e si nʼobodo ọnụ mmiri Elisha bubata.

8 Ndị ikom si Saịdọn na Avad bụ ndị na-akwọrọ gị ụgbọ mmiri gị.

Ndị ǹka ndị ikom gị, gị Taịa, nọ nʼụgbọ dịka ndị ọka nʼịkwọ ụgbọ mmiri.

9 Ndị okenye na ndị nka Gebal a maara aha ha nọ nʼime ụgbọ mmiri gị.

Ọrụ ha bụ imechisi oghere ọbụla dị nʼụgbọ ahụ.

Ụgbọ mmiri niile na ndị na-anya ha

na-abata nʼọnụ mmiri gị nʼihi ịzụ ihe ahịa gị.

10 " Ndị ikom Peshịa na Lidiya,27:10 Maọbụ, Lud na Put,

jere gị ozi dịka ndị agha nʼusuu ndị agha gị.

Ha kokwasịrị ọta ha na okpu agha igwe ha nʼaja ụlọ gị,

na-ewetara gị ebube.

11 Ndị ikom Avad, na Helek

bụ ndị na-eche mgbidi gị nʼakụkụ niile.

Ndị ikom Gamad

na-eche nche nʼụlọ elu gị niile e wusiri ike.

Ha konyekwara ọta ha nʼusoro na mgbidi gị,

ime ka ịma mma gị zuo oke.

12 " Tashish bụ onye ahịa gị, nʼihi ịba ụba nke akụ gị. bụ ọlaọcha na igwe, na gbamgbam, na opu, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.

13 " Ndị Griis,27:13 Maọbụ, Javan Tubal na Meshek, bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-ebutere gị ndị ohu, na ihe e ji bronz kpụọ, iji kwụọ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.

14 " Otu a kwa ndị ikom Bet Togama jikwa ịnyịnya ụgbọ, na ịnyịnya agha, na ịnyịnya ibu na-agbanwere27:14 Nke a bụ nʼọnọdụ ịkwụ ụgwọ, mgbe ụfọdụ ọ bụrụ na mmadụ ejighị ego, o nwere ike jiri ihe o nwere kwụọ ụgwọ ihe ọ zuru, site nʼụzọ ịgbanwere ihe. ihe ha zụrụ.

15 " Ndị ahịa si na Dedan bụkwa ndị ahịa gị. Otu a kwa ọtụtụ ndị bi nʼọnụ mmiri bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ọdụ, na osisi eboni kwụọ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.

16 " Ndị Aram ka gị na ha zụrụ ahịa nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa gị. Ha na-ejikwa nkume dị oke ọnụ tọkwọisi na akwa e sijiri esiji odo odo, na akwa a kpara nke ọma, na ezi akwa ọcha, na koral, na nkume oke ọnụahịa rubi na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.

17 " Ndị Juda na ndị Izrel niile bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-eji ọka wiiti nke si nʼobodo Minit, ya na shuga, na mmanụ aṅụ, na mmanụ, na mmanụ otite na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.

18 " Damaskọs bụkwa ndị ahịa gị, nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa na ụba ihe ndị nwere ire ere. bụkwa mmanya si Helbon, na ajị anụ dị ọcha nke esi Zaha weta, 19 na mmanya a gbara nʼudu nʼudu nke si Ụzal, na igwe nwupụrụ enwupụ, na kashia, na kalamus, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.

20 " Dedan bụ onye ahịa gị nʼakwa a na-agbasa nʼelu ịnyịnya anọkwasị ọdụ.

21 " Arebịa na ụmụ eze niile nke Keda bụkwa ndị ahịa gị. bụ ụmụ atụrụ, na ebule, na mkpi, ka gị na ha nʼazụrịta na-erekwa.

22 " Ndị ahịa Sheba, na Raama, bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ụda dị iche iche na nkume dị oke ọnụahịa, na ọlaedo akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ.

23 " Ndị Haran, Kanne na Eden, na ndị ahịa Sheba, Ashọ na Kilmad, bụ ndị gị na ha zụkọrọ ahịa. 24 Ha na-eweta uwe mara mma dị iche iche, na akwa e tejiri anụnụ anụnụ, na akwa a kpara nke ọma, na kapeeti mara mma dị iche iche, nke e ji ụdọ kpazie nke ọma, nke e tejiri nʼụdị dịkwa iche iche nʼọma ahịa gị.

25 " Ụgbọ mmiri niile nke Tashish

bụ ndị na-ebu ihe ahịa gị.

I jupụtara nʼihe ahịa,

gị obodo dị nʼetiti mmiri.

26 Ndị na-anyagharị ụgbọ mmiri gị

na-ebuba gị nʼosimiri.

Ma ifufe siri ike nke si nʼọwụwa anyanwụ

ga-etiwasị gị nʼetiti osimiri.

27 Akụ gị niile, na ngwa ahịa gị niile, na ihe ịzụ ahịa gị niile,

na ndị niile na-arụ ọrụ nʼụgbọ mmiri gị, na ndị na-anya ụgbọ mmiri, ma ndị na-edozi ụgbọ mmiri gị,

ma ndị na-azụ ahịa gị, ma ndị agha gị niile,

ha na ndị niile nọ nʼime ụgbọ gị

ka mmiri ga-eri nʼetiti mmiri,

nʼụbọchị ahụ ụgbọ gị ga-emikpu.

28 Ala niile dị nʼọnụ mmiri ga-ama jijiji

mgbe ndị ọka ụgbọ mmiri gị ga-eti mkpu akwa.

29 Ndị niile na-anya ụgbọ mmiri,

na ndị ọka ụgbọ niile nke oke osimiri,

ga-esitekwa nʼụgbọ ha

rịdata guzo nʼelu ala.

30 Ha ga-eti mkpu akwa,

ha ga-akwa akwa nke ukwuu,

werekwa aja wụkwasị onwe ha nʼisi,

na-atụrụkwa onwe ha na ntụ.

31 Ha ga-akpụchapụ agịrị isi ha,

yirikwa akwa mkpe,

kwaa akwa nʼihi ịdị ilu nke mkpụrụobi ha.

Ha ga-etikwa aka ha nʼobi.

32 Mgbe ha ga na-eti mkpu akwa na-erikwa uju nʼihi gị,

nke a bụ abụ akwa a ga-abụ banyere gị,

"Onye ka e mere ka o dere duu ka e si mee obodo Taịa,

nke osimiri gbara gburugburu?"

33 Mgbe e si nʼime gị na-ebupụsị ihe ahịa gị,

e ji ha na-enyeju mba dị iche iche afọ.

E sitekwara nʼakụ gị dị ukwuu na ngwa ahịa gị

mee ka ọtụtụ ndị eze nke ụwa bụrụ ọgaranya.

34 Ugbu a, mmiri e riela gị,

bụ nʼokpuru osimiri ka tọgbọ.

Akụ gị niile na ihe ahịa gị niile,

na ndị niile nọ nʼime gị esorola gị laa nʼiyi.

35 Ihe ndị a niile ga-eju ndị bi nʼala ọnụ mmiri

osimiri niile anya.

Ndị eze ha niile tụkwara egwu nke ukwuu;

ihu ha gbarụkwara agbarụ site nʼegwu.

36 Ndị ahịa nke mba dị iche iche na-efufe isi ha,

nʼihi na ihe mere gị dị egwu.

laala nʼiyi ruo ebighị ebi.’ "

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também