Publicidade

Ezequiel 27

Abụ akwa nʼihi Taịa

1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2 "Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere Taịa, 3 sị ya, gị oke obodo dị nʼọnụ oke osimiri, onye bụ onye ahịa nke mba niile dị nʼọnụ osimiri. ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru:

" ‘Gị onwe gị, bụ Taịa, na-asị,

"Ezuru m oke nʼịma mma."

4 I meela ka oke ala gị dịrị nʼetiti oke osimiri.

Ndị wuru gị emeekwala ka ịma mma gị zuo oke.

5 Osisi e ji wuo ahụ ụgbọ gị

sitere nʼosisi junipa nke si Senia;

ọ bụkwa osisi sida nke si Lebanọn

ka e ji jidesie ihu ụgbọ ahụ ike.

6 Osisi ook nke si Bashan

ka e ji mee ụmara gị niile.

Osisi e si Saiprọs bubata

ka e ji wuo ala ụgbọ gị, jirikwa ọdụ machie ya nʼọnọdụ ịchọ ya mma.

7 Ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke e si Ijipt bubata,

ka e ji mee ọkọlọtọ gị.

Akwa ndo gị bụkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ, na odo odo,

nke e si nʼobodo ọnụ mmiri Elisha bubata.

8 Ndị ikom si Saịdọn na Avad bụ ndị na-akwọrọ gị ụgbọ mmiri gị.

Ndị ǹka ndị ikom gị, gị Taịa, nọ nʼụgbọ dịka ndị ọka nʼịkwọ ụgbọ mmiri.

9 Ndị okenye na ndị nka Gebal a maara aha ha nọ nʼime ụgbọ mmiri gị.

Ọrụ ha bụ imechisi oghere ọbụla dị nʼụgbọ ahụ.

Ụgbọ mmiri niile na ndị na-anya ha

na-abata nʼọnụ mmiri gị nʼihi ịzụ ihe ahịa gị.

10 " ‘Ndị ikom Peshịa na Lidiya, na Put,

jere gị ozi dịka ndị agha nʼusuu ndị agha gị.

Ha kokwasịrị ọta ha na okpu agha igwe ha nʼaja ụlọ gị,

na-ewetara gị ebube.

11 Ndị ikom Avad, na Helek

bụ ndị na-eche mgbidi gị nʼakụkụ niile.

Ndị ikom Gamad

na-eche nche nʼụlọ elu gị niile e wusiri ike.

Ha konyekwara ọta ha nʼusoro na mgbidi gị,

ime ka ịma mma gị zuo oke.

12 " ‘Tashish bụ onye ahịa gị, nʼihi ịba ụba nke akụ gị. Ọ bụ ọlaọcha na igwe, na gbamgbam, na opu, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.

13 " ‘Ndị Griis, Tubal na Meshek, bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-ebutere gị ndị ohu, na ihe e ji bronz kpụọ, iji kwụọ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.

14 " ‘Otu a kwa ndị ikom Bet Togama jikwa ịnyịnya ụgbọ, na ịnyịnya agha, na ịnyịnya ibu na-agbanwere ihe ha zụrụ.

15 " ‘Ndị ahịa si na Dedan bụkwa ndị ahịa gị. Otu a kwa ọtụtụ ndị bi nʼọnụ mmiri bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ọdụ, na osisi eboni kwụọ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.

16 " ‘Ndị Aram ka gị na ha zụrụ ahịa nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa gị. Ha na-ejikwa nkume dị oke ọnụ tọkwọisi na akwa e sijiri esiji odo odo, na akwa a kpara nke ọma, na ezi akwa ọcha, na koral, na nkume oke ọnụahịa rubi na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.

17 " ‘Ndị Juda na ndị Izrel niile bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-eji ọka wiiti nke si nʼobodo Minit, ya na shuga, na mmanụ aṅụ, na mmanụ, na mmanụ otite na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.

18 " ‘Damaskọs bụkwa ndị ahịa gị, nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa na ụba ihe ndị ị nwere ire ere. Ọ bụkwa mmanya si Helbon, na ajị anụ dị ọcha nke esi Zaha weta, 19 na mmanya a gbara nʼudu nʼudu nke si Ụzal, na igwe nwupụrụ enwupụ, na kashia, na kalamus, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.

20 " ‘Dedan bụ onye ahịa gị nʼakwa a na-agbasa nʼelu ịnyịnya anọkwasị ọdụ.

21 " ‘Arebịa na ụmụ eze niile nke Keda bụkwa ndị ahịa gị. Ọ bụ ụmụ atụrụ, na ebule, na mkpi, ka gị na ha nʼazụrịta na-erekwa.

22 " ‘Ndị ahịa Sheba, na Raama, bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ụda dị iche iche na nkume dị oke ọnụahịa, na ọlaedo akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ.

23 " ‘Ndị Haran, Kanne na Eden, na ndị ahịa Sheba, Ashọ na Kilmad, bụ ndị gị na ha zụkọrọ ahịa. 24 Ha na-eweta uwe mara mma dị iche iche, na akwa e tejiri anụnụ anụnụ, na akwa a kpara nke ọma, na kapeeti mara mma dị iche iche, nke e ji ụdọ kpazie nke ọma, nke e tejiri nʼụdị dịkwa iche iche nʼọma ahịa gị.

25 " ‘Ụgbọ mmiri niile nke Tashish

bụ ndị na-ebu ihe ahịa gị.

I jupụtara nʼihe ahịa,

gị obodo dị nʼetiti mmiri.

26 Ndị na-anyagharị ụgbọ mmiri gị

na-ebuba gị nʼosimiri.

Ma ifufe siri ike nke si nʼọwụwa anyanwụ

ga-etiwasị gị nʼetiti osimiri.

27 Akụ gị niile, na ngwa ahịa gị niile, na ihe ịzụ ahịa gị niile,

na ndị niile na-arụ ọrụ nʼụgbọ mmiri gị, na ndị na-anya ụgbọ mmiri, ma ndị na-edozi ụgbọ mmiri gị,

ma ndị na-azụ ahịa gị, ma ndị agha gị niile,

ha na ndị niile nọ nʼime ụgbọ gị

ka mmiri ga-eri nʼetiti mmiri,

nʼụbọchị ahụ ụgbọ gị ga-emikpu.

28 Ala niile dị nʼọnụ mmiri ga-ama jijiji

mgbe ndị ọka ụgbọ mmiri gị ga-eti mkpu akwa.

29 Ndị niile na-anya ụgbọ mmiri,

na ndị ọka ụgbọ niile nke oke osimiri,

ga-esitekwa nʼụgbọ ha

rịdata guzo nʼelu ala.

30 Ha ga-eti mkpu akwa,

ha ga-akwa akwa nke ukwuu,

werekwa aja wụkwasị onwe ha nʼisi,

na-atụrụkwa onwe ha na ntụ.

31 Ha ga-akpụchapụ agịrị isi ha,

yirikwa akwa mkpe,

kwaa akwa nʼihi ịdị ilu nke mkpụrụobi ha.

Ha ga-etikwa aka ha nʼobi.

32 Mgbe ha ga na-eti mkpu akwa na-erikwa uju nʼihi gị,

nke a bụ abụ akwa a ga-abụ banyere gị,

"Onye ka e mere ka o dere duu ka e si mee obodo Taịa,

nke osimiri gbara gburugburu?"

33 Mgbe e si nʼime gị na-ebupụsị ihe ahịa gị,

e ji ha na-enyeju mba dị iche iche afọ.

E sitekwara nʼakụ gị dị ukwuu na ngwa ahịa gị

mee ka ọtụtụ ndị eze nke ụwa bụrụ ọgaranya.

34 Ugbu a, mmiri e riela gị,

ọ bụ nʼokpuru osimiri ka ị tọgbọ.

Akụ gị niile na ihe ahịa gị niile,

na ndị niile nọ nʼime gị esorola gị laa nʼiyi.

35 Ihe ndị a niile ga-eju ndị bi nʼala ọnụ mmiri

osimiri niile anya.

Ndị eze ha niile tụkwara egwu nke ukwuu;

ihu ha gbarụkwara agbarụ site nʼegwu.

36 Ndị ahịa nke mba dị iche iche na-efufe isi ha,

nʼihi na ihe mere gị dị egwu.

Ị laala nʼiyi ruo ebighị ebi.’ "

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-