Pular para o conteúdo
Publicidade

Izikiel 12

Ihe ngosi maka ndọta nʼagha

1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2 "Nwa nke mmadụ, i bi nʼetiti ndị na-enupu isi, ndị nwere anya ịhụ ụzọ ma ha adịghị ahụ; ndị nwere ntị ịnụ ihe ma ha adịghị anụ ihe, nʼihi na ha bụ ndị nnupu isi.

3 "Ya mere, nwa nke mmadụ, kwakọtaa ngwongwo ụlọ gị maka ga biri nʼala ọzọ, mee nke a nʼehihie dịka ha na-ele gị anya, hapụ ụlọ gị gaa nʼebe ọzọ. Ma eleghị anya ha ga-aghọta, bụ ezie na ha bụ ndị nnupu isi. 4 Kwapụta ngwongwo gị nʼezi nʼehihie ka ha hụ ya. Ma hapụ ụlọ gị nʼabalị dịka ndị na-agba ọsọ ndụ si eme, mgbe ha na-amalite ije ha, nke ịga ibi nʼala ọzọ. 5 Mgbe ha na-ele gị anya, gwupuo mgbidi, site na ya kwara ngwongwo gị pụọ. 6 Mgbe ha nọ na-ele gị anya, bulie ibu gị, tụkwasị ya nʼubu gị, pụọ gawa nʼime ọchịchịrị, kpuchie ihu gị, ka ghara ihu ala ahụ anya. Nʼihi na emela m gị ihe ịrịbama nye ụlọ Izrel niile."

7 Emere m ihe e nyere m nʼiwu. Ebupụtara m ngwongwo m nʼehihie, jikọta ha maka ịgba ọsọ ndụ. Nʼanyasị, eji m aka m gwuo ọnụ na mgbidi ahụ. Ebukwasịrị m ngwongwo m nʼubu, bulie ije nʼime ọchịchịrị mgbe ha nọ na-ele m anya.

8 Nʼụtụtụ echi ya, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m, 9 "Nwa nke mmadụ, bụ na ụlọ Izrel ndị nnupu isi ahụ ajụbeghị gị, o lee ihe na-eme?

10 "Gwa ha, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Amụma a bụ maka onyeisi nọ na Jerusalem, nʼụlọ Izrel niile nọkwa ebe ahụ.11 Sị ha, Mụ onwe m bụ ihe ama nye unu.

"Dịka m mere, otu a kwa ka a ga-eme nye ha. Ha ga-aga na mba ọzọ biri ka ndị a dọtara nʼagha.

12 "Nwa eze nke nọ nʼetiti ha ga-amaburu ibu ya nʼubu pụọ nʼọchịchịrị, ga-egwupụ mgbidi aja nke obodo site nʼebe ahụ pụọ. ga-ekpuchikwa ihu ya ka ghara iji anya ya hụ obodo ahụ. 13 Ma aga m eji ụgbụ m jide ya, meekwa ka bịaruo Babilọn bụ ala ndị Kaldịa. Ebe ahụ ka ga-anọ nwụọ, ma gaghị ahụ ya anya. 14 Ndị niile gbara ya gburugburu na ndị agha ya niile ka m ga-achụsa nʼala niile, bụkwa mma agha ka m ga-amịpụta jiri chụọ ha ọsọ.

15 "Ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m chụsachara ha nʼetiti mba niile dị iche iche, fesaakwa ha nʼala niile. 16 Ma bụ mmadụ ole na ole nʼime ha ka m ga-edebe ndụ site na mma agha, na ụnwụ na ọrịa na-efe efe. Ka ha nwee ike kọọ akụkọ ihe arụ niile ha nʼetiti mba dị iche iche ebe ha gbagara ọsọ. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị."

17 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 18 "Nwa nke mmadụ, tụọ egwu mgbe na-eri nri gị. Jirikwa ihe ọtụtụ tụpụta mmiri ọṅụṅụ gị, dịka a ga-asị na bụ ihe ikpeazụ i nwere. 19 ga-asịkwa ndị bi nʼala ahụ, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu banyere ndị bi na Jerusalem, nʼala nke Izrel, sị, Ha ga-eji ụjọ rie achịcha ha, jirikwa obi ịlọ mmiri ṅụọ mmiri ha, nʼihi na a ga-ekpochapụ ihe niile dị nʼala ha, nʼihi ihe ike nke ndị bi nʼime ya. 20 Obodo niile nke ndị mmadụ bi nʼime ya ga-ala nʼiyi, otu aka ahụ, ala unu niile ga-abụ ebe tọgbọrọ na nkịtị. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe bụ Onyenwe anyị.’ "

gaghị adị anya mmezu

21 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 22 "Nwa nke mmadụ, kedụ ihe ilu a na-atụ nʼIzrel pụtara, nke na-asị Ụbọchị adịla oke anya, ọhụ niile abụrụkwala ihe na-enweghị isi?23 Gwa ha, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Aga m eme ka ilu a kwụsị, ha agaghị atụkwa ya dịka ilu nʼIzrel ọzọ.Kama gwa ha, Nʼụbọchị ahụ adịla nso mgbe ọhụ niile ga-emezu. 24 Nʼihi na agaghị enwekwa ọhụ ụgha ọzọ, maọbụ ịjụ ase ire ụtọ nʼetiti ụlọ Izrel. 25 Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-ekwu ihe m zubere. Ihe ọbụla m kwuru ga-emezu na-atụfughị oge. Nʼihi na bụ nʼoge unu dị ndụ, unu ndị nnupu isi, ka m ga-emezu ihe ọbụla bụ nke m kwuru. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’ "

26 Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m, 27 "Nwa nke mmadụ, lee, ụlọ nke Izrel na-asị, Ọhụ niile na-ahụ bụ maka ọtụtụ afọ dị nʼihu, amụma ya bụkwa maka oge na-abịa nʼihu.

28 "Nʼihi ya, gwa ha, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, dịghịkwa okwu m nke a ga-atụfu oge ọzọ nʼime ya, ihe ọbụla m kwuru ka a ga-emezu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’ "

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também