Publicidade

Ezequiel 19

Abụ akwa nʼihi ọnọdụ ụmụ eze Izrel

1 "Ma gị onwe gị, bụọrọnụ ndịisi Izrel abụ akwa a, 2 ma kwuo,

" ‘Ụdị nne Ọdụm gịnị ka nne gị bụ

nʼetiti ụmụ ọdụm.

Ọ dinara nʼetiti ha,

na-azụ ụmụ ya.

3 Ọ zụlitere otu nʼime ụmụ ya

nke ghọrọ nwa ọdụm siri ike.

Ọ mụtakwara ka e si adọrisi anụ ọhịa,

ghọọ ọdụm na-eri mmadụ.

4 Mba niile nụrụ maka ihe banyere ya,

mee ka ọ danye nʼolulu ha gwuru.

Ha ji nko koro ya,

duru ya gaa nʼala Ijipt.

5 " ‘Mgbe ọ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe ọzọ o nwere ike ime banyere ọnọdụ ahụ,

matakwa na olileanya ya abụrụla ihe efu,

ọ họpụtara nwa ya ọzọ

kuziere ya otu ọ ga-esi bụrụ ọdụm dị ike.

6 Ọ ghọrọ onyeisi ụmụ ọdụm niile,

nʼihi na ọ bụ ọdụm siri ike,

ọ mụtakwara ka e si ejide anụ ọhịa,

ya onwe ya ghọkwara ọdụm na-eri mmadụ.

7 O tikpọrọ ebe ha niile e wusiri ike

meekwa obodo ha niile mkpọmkpọ ebe.

Ala ahụ na ndị niile nọ nʼime ya,

mara jijiji site nʼoke egwu nʼihi olu ịgbọ ụja ya.

8 Mgbe ahụ, ndị agha nke mba niile dị iche iche

pụtara gbaa ya gburugburu.

Ha sitere nʼakụkụ niile nwude ya

nʼọnya olulu ha siiri ya.

9 Ha tinyere ya nko nʼimi, were dọkpuo ya nʼụlọ igwe a kpara akpa,

bute ya nʼihu eze Babilọn.

E mere ka o biri na mba ọzọ dịka ohu,

ka a ghara ịnụ ụda olu ya ọzọ

nʼugwu niile nke Izrel.

10 " ‘Nne gị dịka osisi vaịnị nʼogige vaịnị

a kụrụ nʼakụkụ mmiri,

nke nwere ọtụtụ alaka, nke na-amịkwa mkpụrụ

nʼihi mmiri ọ na-enweta.

11 Alaka ya niile siri ike,

ha topụtara ghọọ mkpara eze.

O topụrụ etopụ,

tokarịa alaka ndị ọzọ elu.

Nke a mere e ji na-ahụ ya anya

site nʼebe dị anya.

12 Ma e ji oke iwe hopu ya

tụpụ ya nʼala.

Oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ mere ka akwụkwọ ya kpọnwụsịa,

meekwa ka mkpụrụ ya daa.

Alaka ya ndị ahụ dị ike kpọnwụsịrị,

ọkụ rechapụkwara ha niile.

13 Ugbu a, akụọla ya nʼime ọzara

ebe kpọrọ nkụ nke mmiri na-adịghị.

14 Ọkụ esitela nʼogwe ya rechapụ alaka ya

na mkpụrụ ya niile.

Ọ dịkwaghị alaka siri ike fọdụrụ

nke dịkwa mma ịbụ mkpara eze.’

Abụ a bụ abụ akwa, nke e kwesiri ịbụ mgbe ịkwa akwa."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-