Pular para o conteúdo
Publicidade

Izikiel 33

Nlọghachi Izikiel dịka onye nche

1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2 "Nwa nke mmadụ, gwa ndị gị okwu sị ha, Mgbe m wetara mma agha imegide mba ọbụla, ma ndị ala ahụ ahọpụta otu onye nʼetiti ha mee ya ka ghọrọ ha onye nche, 3 onye ga-ahụ mma agha ka na-abịakwasị ala ahụ, bụrụ na o gbuo opi ike, ịdọ ndị bi na mba ahụ aka na ntị banyere mma agha nke na-abịa, 4 bụrụkwa na onye ọbụla anụ opi ike ahụ ma jụ ịnabatara onwe ya ịdọ aka na ntị ahụ, mma agha ahụ gbuo ya, ọbara ya ga-adịkwasị ya nʼisi. 5 Nʼihi na ha nụrụ ụda opi nke ịdọ aka na ntị ahụ ma ha geghị ntị. bụ ha wetaara onwe ha ịla nʼiyi. A sị na ha gere ntị ha gaara azọpụta ndụ ha. 6 Ma bụrụ na onye nche elepụ anya hụ ndị agha ka ha na-abịa hapụ igbu opi ịdọ ndị mmadụ aka na ntị, ọnwụ ha dị nʼisi ya. Ha ga-anwụ nʼime mmehie ha, ma aga m ajụta ọbara ha site nʼaka onye nche ahụ.

7 "Nwa nke mmadụ, emeela m gị ka bụrụ onye nche nye ụlọ Izrel. Nʼihi ya, gee ntị nʼihe m na-ekwu, ka dọọrọ m ha aka na ntị. 8 Mgbe m na-asị onye ajọ omume, gị onye na-emebi iwu, ghaghị ịnwụ! bụrụ na kwughị okwu, ime ka o chigharịa site nʼụzọ ya pụta, onye ahụ na-emebi iwu ga-anwụ nʼihi mmehie ya niile, ma nʼaka gị ka m ga-ajụta ọbara ha. 9 Ma bụrụ na dọọ onye ajọ omume aka na ntị ka o chigharịa site nʼụzọ ya pụta, ma o meghị nke a, ha ga-anwụ nʼihi mmehie ha, ma ndụ gị onwe gị ka zọpụtara.

10 "Nwa nke mmadụ, gwa ụlọ Izrel, Otu a ka unu na-ekwu, "Njehie niile anyị na mmehie niile anyị adịla arọ nʼahụ anyị. bụkwa nʼime ya ka anyị na-ata ahụ. Olee otu anyị ga-esi dị ndụ?" 11 Gwa ha, Dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, ọnwụ onye na-emebi iwu adịghị atọ m ụtọ, kama na-atọ m ụtọ mgbe onye na-emebi iwu sitere nʼụzọ33:11 Ụzọ nʼebe a, na-ekwu maka mmebi iwu ya chegharịa dịrị ndụ. Chigharịanụ, sitenụ nʼụzọ ọjọọ33:11 Maọbụ, mmehie unu unu niile chigharịa. Nʼihi gịnị ka unu ga-eji nwụọ, unu bụ ụlọ Izrel?

12 "Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, gwa ndị ala gị, Ezi omume nke onye na-eme ezi ihe agaghị azọpụta ya ma bụrụ na tụgharịa, mee ihe ọjọọ. Otu a kwa, mmehie niile nke onye na-emebi iwu agaghị eme ka laa nʼiyi ma bụrụ na o chegharịa pụọ site na mmehie.13 bụrụ na m asị onye ezi omume, na ghaghị ịdị ndụ, ma onye dị otu a atụkwasị obi nʼezi omume ya mee ajọ ihe, dịghị ihe ezi omume nke onye dị otu a mere nke a ga-echetakwa. Ha ga-anwụ nʼihi ajọ ihe ha mere. 14 Ma bụrụ na m asị onye ajọ omume, ghaghị ịnwụ,ma onye ahụ esite na mmehie ya chigharịa, mee ihe ziri ezi na nke dị mma, 15 bụrụ na o nyeghachi ihe ebe naara nʼaka ndị gbazinyere ego, kwụghachi ihe niile o zuuru nʼohi, gbasoo ụkpụrụ ahụ niile bụ nke na-enye ndụ, gharakwa ime ajọ omume; onye dị otu a aghaghị ịdị ndụ, gaghị anwụ. 16 dịghị mmehie niile nke onye ahụ mere nke a ga-echeta megide ya. Nʼihi na o meela ihe ziri ezi na nke dịkwa mma, gaghị ịdị ndụ.

17 "Ma ndị gị na-asị, Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi.Ma bụ ụzọ ha bụ nke na-ezighị ezi. 18 bụrụ na onye ezi omume esite nʼezi omume ya chigharịa malite ime ihe ọjọọ, ga-anwụ maka ya. 19 Ma bụrụ na onye ajọ omume esite nʼajọ omume ya chigharịa malite ime ihe ziri ezi na nke dị mma, ga-adị ndụ site nʼime nke a. 20 Ma unu bụ ụlọ Izrel na-asị, Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi.Ma aga m ekpe onye ọbụla nʼime unu ikpe dịka ụzọ ya si dị."

Nkọwa maka ọdịda Jerusalem

21 O ruo nʼafọ nke iri na abụọ nke e mere ka anyị jee biri na mba ọzọ, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke ise nke ọnwa ahụ, otu onye nʼime ndị sitere na Jerusalem gbapụ bịakwutere m gwa m sị, "Obodo ahụ adaala." 22 Ma nʼanyasị, tupu onye ahụ gbapụrụ agbapụ abịa, aka Onyenwe anyị ruru m ahụ, mee ka m nweekwa ike ikwu okwu ọzọ.

23 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 24 "Nwa nke mmadụ, ndị ahụ bi nʼebe dakpọsịrị adakpọsị nʼala Izrel na-asị, Ebraham bụ otu nwoke, ma o nwetachara ala a niile! Ma anyị dị ukwuu, nʼihi enyela anyị ala dịka ihe nweta anyị.25 Ya mere, gwa ha, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ebe bụ na unu na-eri anụ nke ọbara dị nʼime ya, na-elekwasịkwa arụsị unu anya, na-awụsikwa ọbara, o kwesiri ka unu nweta ala a? 26 Unu na-atụkwasị obi unu na mma agha unu, unu na-eme ihe arụ dị iche iche, onye ọbụla nʼime unu na-emerụ nwunye onye agbataobi ya. bụkwa ala nke a ka unu ga-enweta?

27 "Gwa ha nke a, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, dịka m na-adị ndụ, ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ e tikpọrọ etikpọ ga-anwụcha site na mma agha. Ndị bi nʼọhịa ka anụ ọhịa ga-atagbu. Ndị niile bi nʼọgba na nʼebe niile e wusiri ike ga-anwụ site nʼọrịa. 28 Aga m eme ka ala unu ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Nganga ya, na ike ya ga-agwụsị. Obodo niile dị nʼugwu Izrel ga-aghọ ebe e tikpọrọ etikpọ, mmadụ agakwaghị esite nʼebe ahụ gafee ọzọ. 29 Ha ga-amakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m mesiri ka ala ahụ ghọọ mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ nʼefu, nʼihi ihe arụ niile nke ha mere.

30 "Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, ndị ala gị na-ekwu banyere gị nʼakụkụ mgbidi ha na nʼọnụ ụzọ ụlọ ha. Ha na-asịrịta onwe ha, Bịanụ ka anyị gaa nụrụ ozi sitere nʼọnụ Onyenwe anyị.31 Ha na-abịakwute gị dịka ndị mmadụ si abịa, ha na-anọrọ ala nʼihu gị na-anụ ihe na-ekwu ma ha anaghị emepụta ya nʼomume: nʼihi na ha na-eji egbugbere ọnụ ha na-egosi ịhụnanya, ma obi ha nọ naanị na uru ọjọọ ha ga-enweta. 32 Nʼanya ha, dịka onye ji ezigbo olu na-ekwe ukwe ịhụnanya, dịka onye nwere olu ụtọ, nke na-abụ abụ dị ụtọ, na onye maara ka e si eti ịgba. Ha na-anụ ihe na-ekwu ma ha ejighị ya kpọrọ ihe ọbụla.

33 "Ma mgbe nke a bịara na mmezu, nʼihi ghaghị ịbịa, ha ga-amata na onye amụma anọtụla nʼetiti ha."

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também