Publicidade

Ezequiel 30

Abụ akwa nʼihi Ijipt

1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2 "Nwa nke mmadụ, buo amụma sịkwa, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,

" ‘Kwasienụ akwa ike ma sị,

"Ewoo, nʼihi ụbọchị ahụ!"

3 Nʼihi nʼụbọchị ahụ adịla nso,

Ụbọchị nke Onyenwe anyị abịala nso,

ụbọchị igwe ojii,

ụbọchị ga-ewetara mba dị iche iche mbibi.

4 Mma agha ga-abịakwasị Ijipt,

ihe mgbu ga-adakwasị Kush.

Mgbe ndị e gburu egbu ga-abụ aja dị nʼala,

a ga-ekpokọrọkwa akụnụba ya,

mebikwaa ntọala ya. Ala ya ga-abụkwa ihe e bibiri ebibi.

5 Kush na Libiya, Lidiya na ndị Arebịa niile gwara ọgwa, Kub na ndị mba ọgbụgba ndụ ahụ, na Ijipt ga-eso daa site na mma agha.

6 " ‘Ọ bụ ihe a ka Onyenwe anyị kwuru:

" ‘Ndị niile na-akwagide Ijipt ga-ada,

nganga niile nke ike ya ga-agwụsịkwa.

Site na Migdol ruo nʼAswan,

ọ bụ site na mma agha ka ha ga-ada nʼime ya.

Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

7 Ha ga-atọgbọrọ nʼefu,

nʼetiti ala niile tọgbọrọ nʼefu.

Obodo ha niile ga-abụ mkpọmkpọ ebe,

nʼetiti ọtụtụ obodo e bibiri ebibi.

8 Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị,

mgbe m tinyesịrị ọkụ nʼIjipt,

mgbe m gwepịara ndị niile na-enyere ya aka.

9 " ‘Nʼụbọchị ahụ, aga m ezipu ndị ozi ndị ga-eji ụgbọ dị iche iche, ka ha gaa menye ndị Kush egwu, bụ ndị onwe ha jụrụ afọ. Oke egwu ga-ejidekwa ha nʼoge ahụ nʼihi ihe dakwasịrị Ijipt, nʼihi ihe ndị a aghaghị imezu.

10 " ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,

" ‘Aga m esite nʼaka Nebukadneza eze Babilọn

bibie igwe ndị agha Ijipt niile.

11 Ya onwe ya na ndị agha ya, bụ mba kachasị mba niile njọ na-enweghị obi ebere,

ka a ga-akpọbata ka ha bịa bibie ala ahụ.

Ha ga-amịpụta mma agha ha megide Ijipt,

werekwa ozu ndị e gburu egbu tụsasịa nʼala ahụ.

12 Aga m eme ka osimiri Naịl taa. Ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ.

Aga m ewerekwa ala ahụ resi mba ndị ọjọọ.

Aga m ala ala ahụ na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi.

Ọ bụkwa ndị mba ọzọ ka m ga-eji mee ya.

Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya.

13 " ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,

" ‘M ga-ala arụsị niile nʼiyi,

mekwaa ka ihe niile a kpụrụ akpụ dị na Memfis kwụsị.

Onye eze agakwaghị adị ọzọ nʼIjipt,

aga m emekwa ka egwu jupụta nʼala ahụ niile.

14 Aga m emekwa ka Patros tọgbọrọ nʼefu.

Aga m etinye ọkụ na Zoan,

ma taa Tibs ahụhụ.

15 M ga-awụkwasị Pelusium ọnụma m,

bụ ebe siri ike nke Ijipt,

m ga-ebipụkwa igwe ndị Tibs niile.

16 Aga m amụnye ọkụ nʼIjipt,

Pelusium ga-anọ nʼoke ihe mgbu.

A ga-eji ike tipịa Tibs.

Memfis ga-anọgidekwa nʼọnọdụ ọjọọ ụbọchị niile.

17 Ụmụ okorobịa Heliopolis na Bubasti

ga-anwụ site na mma agha.

Obodo ndị a niile ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha.

18 Ụbọchị ahụ ga-agba ọchịchịrị na Tapanhis

mgbe m ga-agbaji yoku Ijipt,

nʼebe ahụ ka mpako nke ike ya ga-agwụsị.

Igwe ojii ga-ekpuchi ya,

a ga-adọtakwa obodo nta ya niile nʼagha.

19 Aga m eme ka Ijipt taa ahụhụ dị ukwuu,

ka ha mata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ "

Aka Fero agbajiela

20 O ruo, nʼafọ nke iri na otu ya, nʼụbọchị nke asaa, nʼọnwa nke mbụ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 21 "Nwa nke mmadụ, agbajiela m ogwe aka Fero, eze Ijipt. Lee, o nwebeghị onye gbara ya ọkpụkpụ, ma ọ bụkwanụ kee ya ihe, ka o sie ike ọzọ ijide mma agha. 22 Nʼihi ya, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: Lee, mụ onwe m na-emegide Fero bụ eze Ijipt. Aga m agbaji ogwe aka ya abụọ, ma nke siri ike ma nke gbajiri agbaji na mbụ. Aga m emekwa ka mma agha ya si nʼaka ya dapụ. 23 Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile tụsaakwa ha nʼobodo niile, 24 meekwa ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike. Aga m etinye mma agha m nʼaka ya, ma ogwe aka abụọ nke Fero ka m ga-agbajisi. Mgbe ahụ, Fero ga-asụ ude nʼihu eze Babilọn dịka onye e merụrụ ahụ. 25 Aga m eme ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike; ma ogwe aka Fero ga-akpọnwụ. Mgbe ahụ, ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tinyere mma agha nʼaka eze Babilọn, na mgbe o setịpụrụ ya imegide Ijipt. 26 Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile, fesaa ha nʼala niile. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-19_11-20-24-