40 Ma onye nke ọzọ a makwara ikpe ọnwụ baara ya mba sị, "Ị naghị atụ Chineke egwu, ị hụghị na a mara gị ikpe dị ka e si maa ya. 41 Anyị na-ata ahụhụ kwesiri anyị, nʼihi na a na-ata anyị ahụhụ nʼihi ihe anyị mere, ma nwoke a emeghị ihe ọjọọ ọbụla."
42 Mgbe ahụ ọ sịrị, "Jisọs, chetakwa m mgbe ị bara nʼalaeze gị."
43 Ọ sịrị ya, "Nʼezie a agwa m gị, taa, ị ga-anọnyere m na paradaịs."