Ọkpụkpọ ndị mbụ na-eso ụzọ ya
1 Otu oge, ka Jisọs guzo nʼakụkụ ọdọ mmiri Genesaret.5:1 Maọbụ, osimiri Galili Igwe mmadụ gbara ya gburugburu ka ha nụrụ okwu Chineke. 2 Ọ hụrụ nʼọnụ mmiri ahụ, ụgbọ mmiri abụọ nke ndị ọkụ azụ nwe ha hapụrụ gaa ịsa ụgbụ ha ji egbu azụ. 3 Ọ banyere nʼime otu ụgbọ mmiri ndị ahụ, nke bụ nke Saimọn, ọ rịọrọ ya ka ọ kwọrọ ya banyetụ ntakịrị nʼime mmiri. Ọ nọdụrụ ala nʼime ya bido na-ezi igwe mmadụ ihe.
4 Mgbe o kwusiri okwu, ọ gwara Saimọn sị, "Banyetụkwuo nʼime mmiri, tụnye ụgbụ gị ka i gbute azụ."
5 Saimọn zara sị, "Nna anyị ukwuu, anyị rụsịrị ọrụ ike abalị niile na-egbutaghị ihe ọbụla, ma otu i sịrị kwuo, aga m awụnye ụgbụ azụ niile."
6 Mgbe ha mere nke a, ha gbutere ọtụtụ azụ nke mere na ụgbụ azụ ha malitere ịdọkasị. 7 Ha kpọrọ ndị ọkụ azụ ibe ha nọ nʼụgbọ mmiri ọzọ ka ha bịa nyere ha aka. Ha bịara kpojuo azụ nʼụgbọ mmiri abụọ ahụ nke malitere imikpu.
8 Ma mgbe Saimọn Pita hụrụ nke a, ọ dara nʼukwu Jisọs sị, "Si nʼebe m nọ pụọ, Onyenwe m, nʼihi na abụ m onye mmehie." 9 Nʼihi na o juru ya na ndị ya na ha so anya ịhụ ọtụtụ azụ ndị a ha gbutere. 10 Ọ bụladị Jemis na Jọn ụmụ Zebedi, ndị ha na Saimọn na-arụkọ ọrụ, ka ihe a jukwara anya.
Mgbe ahụ Jisọs gwara Saimọn sị, "Atụla egwu, nʼihi na site ugbu a gaa nʼihu, ị ga na-akụta mmadụ." 11 Mgbe ha kwọpụtara ụgbọ mmiri ha nʼelu ala, ha hapụrụ ihe niile soro ya.